3
Ọdịnihu Jerusalem
1 Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu,
na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya.
2 Ọ naghị ege onye ọbụla ntị,
ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị.
Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi,
ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
3 Ndịisi nọ nʼetiti ya
dịka ọdụm na-agbọ ụja,
ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị,
nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ.
4 Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ,
ha bụkwa ndị aghụghọ.
Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọ
na-ejikwa ike emebi iwu.
5 Ma Onyenwe anyị , onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume.
Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ.[a]
Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè;
ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya,
ma ndị ajọ omume enweghị ihere.
Jerusalem anọgide na nnupu isi
6 “Egbuchapụla m mba niile dị iche iche,
kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike.
Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ,[b]
ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga.
A laala obodo ha niile nʼiyi,
ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye.
7 Asịrị m, banyere Jerusalem,
‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m,
ma nabatakwa ntụziaka.’[c]
Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya,
ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya.
Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihu
mee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere.
8 Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe.[d]
Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche,
na ịkpọkọta alaeze niile,
ịwụkwasị ha oke iwe m,
ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m.
Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m,
ka a ga-eji rechapụ ụwa niile.
Nlọghachi nke ụmụ Izrel ndị fọdụrụ
9 “Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ[e] ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha,
ka ha niile nwee ike ịkpọku aha Onyenwe anyị ,
ma jikọta aka fekwaa ya ofufe.
10 Site nʼofe osimiri niile nke Kush,[f]
bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m,
ga-ewetara m onyinye dị iche iche.
11 Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị,
nʼihi omume njehie niile i jere megide m,
nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niile
na-aṅụrị ọṅụ[g] na mpako ha.
A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elu
nʼugwu nsọ m.
12 Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi,
na ndị dị umeala nʼobi
fọdụ nʼetiti ndị Izrel,
ha ga-agbabakwa[h] nʼaha Onyenwe anyị .
13 Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ,
ha agaghị ekwu okwu ụgha.
Ire na-ekwu okwu aghụghọ
agaghị adịkwa nʼọnụ ha.
Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala,
ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.”
14 Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn;
tie mkpu, gị Izrel.
Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ,
gị nwaada Jerusalem.
15 Nʼihi na Onyenwe anyị ewezugala ahụhụ dịrị gị,
chụghachikwa ndị iro gị azụ.
Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ.
16 Nʼụbọchị ahụ,
ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ,
“Atụla egwu, gị Zayọn,
ekwela ka aka gị daa mba.
17 Onyenwe anyị bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,
ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.
Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;
nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,[i]
kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.”
18 “Nʼụbọchị mmemme a kara aka,
aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ,
nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị.
19 Nʼoge ahụ,
aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike.
Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ,
chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ.
Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otuto
nʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere.
20 Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ;
mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ.
Aga m eme ka unu na-ewu ewu
ka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa,
mgbe m ga-eweghachi ihe ọma unu
nʼihu anya unu.”
Ka Onyenwe anyị kwuru.
-
a 3:5 Maọbụ, ihe na-ezighị ezi
b 3:6 Ya bụ, nʼụzọ niile dere duu
c 3:7 Ọ gaghị elegharakwa ntụziaka niile m ziri ya anya
d 3:8 Ụbọchị m ga-ebili ịkwata ihe
e 3:9 Maọbụ, gbanwee okwu ha
f 3:10 Maọbụ, Itiopia
g 3:11 Ya bụ, ndị na-anya isi
h 3:12 Ya bụ, tụkwasị obi
i 3:17 Maọbụ, ọ ga-eme ka ịdị ọhụrụ