1 Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu lọghachiri kpọtee m, dịka e si akpọte onye nọ nʼụra. 2 Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?”
4 A sịrị m mmụọ ozi ahụ na-ekwuru m okwu, “Nna m ukwu, gịnị ka nke a pụtara?”
5 Mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu sịrị m, “Ị na-ekwu na ị maghị ihe ha bụ?”
6 Ọ sịrị m, “Nke a bụ okwu nke
7 “Gịnị ka ị bụ, gị ugwu dị ukwuu? Ị ga-aghọ ala dị larịị nʼihu Zerubabel. Mgbe ahụ, ọ ga-awapụta isi nkume ahụ site nʼiti oke mkpu ọṅụ, ‘Amara! Amara dịrị ya!’ ”
8 Mgbe ahụ, okwu
10 “Onye na-eleda ụbọchị ihe nta anya ebe ọ bụ nʼanya asaa nke
11 Mgbe ahụ, a sịrị m ya, “Gịnị bụ osisi oliv abụọ ahụ dị nʼaka nri na nʼaka ekpe ihe ịdọba oriọna ahụ?”
12 A sịkwara m ya nke ugboro abụọ, “Gịnị bụ alaka osisi oliv abụọ ndị a dị nʼakụkụ okporo ọlaedo abụọ ahụ, nke e si na ha na-awụpụta mmanụ ọlaedo?”
13 Ọ sịrị m, “Ọ pụtara na ị maghị ihe ha bụ?”
14 Mgbe ahụ, ọ sịrị m, “Ndị a bụ mmadụ abụọ a họpụtara tee mmanụ, ife ya ofufe bụ Onyenwe ụwa niile.”
<- Zekaraya 3Zekaraya 5 ->