Abụ Ọma 117
Too ya nʼihi ịhụnanya ya
1 Toonu Onyenwe anyị , unu mba niile dị iche iche.
Jaakwa ya mma, unu ndị niile dị iche iche.
2 Nʼihi na ịhụnanya ya nʼebe anyị nọ dị ukwuu.
Ikwesi ntụkwasị obi Onyenwe anyị na-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi.