Ilu
1 Ndị a bụ ilu Solomọn nwa Devid, eze Izrel.
2 Ọ bụ maka amamihe na ntụziaka,
maka ịghọta okwu niile kwesiri ịghọta nke ọma,
3 nʼihi inweta ntụziaka nʼinwe uche,
ime ezi omume na ikpe ziri ezi nke aghụghọ na-adịghị.
4 Nʼihi ime ka ndị na-enweghị uche nwee ezi uche,
ka ndị na-eto eto nweta ihe ọmụma na izuzu ọma.
5 Ka onye maara ihe gee ntị, tụkwasịkwa ihe nʼihe ọ maara,
ka ndị nwere nghọta nwetakwa ezi ndụmọdụ.
6 Ka ha ghọta ilu niile na okwu niile
na-esi nʼọnụ ndị maara ihe.
7 Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite ihe ọmụma.[a]
Ọ bụkwa naanị ndị nzuzu bụ ndị na-adịghị anabata amamihe na ịdọ aka na ntị.
Okwu mmalite: Nkwado maka ịnabata amamihe
Ịdọ aka na ntị banyere ndị nrafu
8 Nwa m, na-aṅa ntị na ntụziaka nke nna gị
ahapụkwala ndụmọdụ nne gị.
9 Nʼihi na okpu amara ka ha ga-abụrụ isi gị,
bụrụkwa ihe ịnya nʼolu nye gị.
10 Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie ara gị ụra,
ekwenyerela ha, Ekwela![b]
11 Ọ bụrụ na ha asị gị, “Bịa soro anyị; ka anyị zoo onwe anyị,
tigbuo onye ọbụla anyị hụrụ,
bụ onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.
12 Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili,
loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu.
13 Anyị ga-enwetakwa ọtụtụ ihe dị oke ọnụahịa,
nke anyị ga-akwaju nʼụlọ anyị.
14 Soro anyị fee nza gị ka anyị nwaa ike anyị,
ihe ọbụla kwa anyị nwetara, anyị na gị ga-ekekọta ya ọnụ.”
15 Nwa m, ejela ije nʼụzọ ndị dị otu a,
a zọọkwala ụkwụ nʼokporoụzọ ha;
16 nʼihi na ụkwụ ha na-agba ọsọ ime ihe ọjọọ,
na-emekwa ngwangwa iwufu ọbara.
17 Ọ bụ ihe abaghị uru ịgbasa ụgbụ,
nʼebe nnụnụ ọbụla na-ahụ ya anya.
18 Ma ndị a na-esi ọnya nke na-ama ha.
Ha onwe ha ka ọnya ahụ ga-ejide.
19 Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi.
Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.
Jidesie amamihe aka ike
20 Amamihe na-eti mkpu nʼezi ka mmadụ nụ.
Olu ya na-ada ụda nʼama.
21 Ọ bụ nʼisi akụkụ ụzọ nke mkpọtụ dịkarịsịrị ka ọ na-akpọ oku,
nʼọnụ ụzọ ama obodo ka ọ na-anọ ekwupụta okwu ọnụ ya niile.
22 “Unu ndị na-enweghị uche ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide bụrụ ndị ga-ahụ enweghị uche nʼanya?
Ruo ole mgbe ka ndị na-akwa emo ga-anọgide na mmasị ịkwa emo?
Ruo ole mgbe ka ndị nzuzu ga-anọgide na-akpọ ihe ọmụma asị?
23 Ọ bụrụ na unu gere ntị na mba m na-abara unu,
aga m awụpụ echiche niile nke obi m nye unu,
aga m emekwa ka unu mara okwu m.
24 Ma ebe ọ bụ na unu egeghị ntị mgbe m kpọrọ oku,
setịpụkwa aka m nye unu ma ọ dịghị onye ṅara ntị,
25 ebe ọ bụ na unu akpọla ndụmọdụ m asị,
jụkwa ịnabata ịba mba m nye unu,
26 ụbọchị unu ga-adaba na mmekpa ahụ, aga m achị ọchị.
Mgbe ihe egwu bịakwasịrị unu, aga m akwa unu emo.
27 Mgbe oke ihe egwu ga-abịakwasị unu dịka ikuku dị ike,
mgbe nhụju anya ga-erubiga nʼelu unu dịka oke ifufe,
mgbe ịta ahụhụ na nsogbu ga-agbagwoju unu anya.
28 “Agaghị m ege ntị nʼakwa unu, ọ bụ ezie na unu ga na-akpọ m.
Unu ga-achọkwa m ma unu agaghị achọta m.
29 Nʼihi na unu mechiri anya unu nʼebe ihe ọmụma dị,
unu atụghị egwu Onyenwe anyị .
30 Unu aṅaghị ntị na ndụmọdụ m.
Unu lelịrị ịba mba m anya.
31 Ihe niile unu kụrụ ka unu ga-aghọta.
Ọ bụkwa ụzọ unu na ndụmọdụ unu ga-eju unu afọ.
32 Nʼihi na ejezighị ije nke ndị na-enweghị uche na-egbu ha,
ọ bụkwa ọnọdụ afọ ojuju ndị nzuzu ga-alakwa ha nʼiyi.
33 Ma onye na-ege ntị nʼokwu m ga-ebi obi ntụkwasị obi.