34
Oke ala na Kenan
1 Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2 “Nye ndị Izrel iwu sị ha, ‘Mgbe unu banyere nʼala Kenan, ndị a bụ oke ala ndị ahụ unu ga-enweta dịka ihe nketa unu:
3 “ ‘Oke ala unu nʼakụkụ ndịda ga-etinyetụ aka nʼọzara Zin. Ala unu na ala ndị Edọm ga-enwekọ oke ala. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, oke ala ndịda unu ga-ebido na ngwụcha Osimiri Nnu, 4 gafee ndịda Akrabim, gabiga ruo ọzara Zin, gbada ndịda ruo Kadesh Banea. Site nʼebe ahụ ọ ga-aga ruo Haza Ada, gafee ruo Azmọn, 5 ebe ọ ga-echigharị gbasoro iyi Wadi nke Ijipt ma kwụsị nʼosimiri Mediterenịa.
6 Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.
7 Oke ala unu nʼakụkụ ugwu ga-amalite nʼosimiri Mediterenịa ruo nʼugwu Hor. 8 Ọ ga-esitekwa nʼugwu Hor ruo Lebo Hamat, gbatịakwa ruo Zedad, 9 ruo Zifron tutu kwụsị na Haza Enan. Nke a ga-abụ oke ala unu nʼakụkụ ugwu.
10 Oke ala unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ga-ebido na Haza Enan ruo Shefam. 11 Oke ala ahụ ga-agbada site Shefam ruo Ribla nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Ain. Site nʼebe ahụ, ọ ga-agbasoro ndịda ọdịda anyanwụ Osimiri Galili. 12 Mgbe ahụ, ọ ga-aga ogologo ogologo, gbasoro osimiri Jọdan, tutu kwụsị nʼOsimiri Nnu.
“ ‘Nke a bụ ala unu, na oke ala ya nʼakụkụ ọbụla.’ ”
13 Mosis nyere ndị Izrel iwu sị, “Kesaanụ ala a dịka ihe nketa site nʼife nza.
16
19 “Ndị a bụ aha ndị a họpụtara:
“Kaleb nwa Jefune, site nʼebo Juda.
20 Shemuel nwa Amihud, site nʼebo Simiọn
21 Elidad nwa Kislon, site nʼebo Benjamin.
22 Buki nwa Jogli, onyendu si nʼebo Dan.
23 Haniel nwa Efod, onyendu si nʼebo Manase, nwa Josef.
24 Kemuel nwa Shiftan, onyendu si nʼebo Ifrem, nwa Josef.
25 Elizafan nwa Panak, onyendu si nʼebo Zebụlọn.
26 Paltiel nwa Azan, onyendu si nʼebo Isaka.
27 Abihud nwa Shelomi, onyendu si nʼebo Asha.
28 Pedahel nwa Amihud, onyendu si nʼebo Naftalị.”
29 Ndị a bụ ndị ikom Onyenwe anyị nyere iwu si ha kenye ndị Izrel ihe nketa ha nʼala Kenan.
<- Ọnụọgụgụ 33Ọnụọgụgụ 35 ->