1 Mgbe ndị Izrel rutere ala Jeza na Gilead, ndị ebo Ruben na Gad ndị nwere ọtụtụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ chọpụtara na ala ahụ dị mma nke ukwuu maka ịzụ anụ ụlọ. 2 Ya mere, ha bịakwutere Mosis na Elieza onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ Izrel, sị ha, 3 “Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na Beon, 4 bụ ala nke
6 Mosis jụrụ ndị Gad na Ruben ajụjụ sị, “Unu na-ekwu na unu chọrọ ịnọ nʼebe a mgbe ụmụnna unu ndị ikom niile ga-agafe osimiri Jọdan ịlụ agha niile ahụ dị na-eche ha? 7 Ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ji eme ka ndị Izrel daa mba ghara ịgafe banye nʼala ahụ
14 “Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee
16 Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ. 17 Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu. 18 Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye Izrel ọbụla enweta ihe nketa nke ya. 19 Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọdan nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.”
20 Mgbe ahụ, Mosis zara sị ha, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na unu ga-eme dịka unu kwuru, jikere onwe unu, nʼihu
23 “Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ
25 Ndị ebo Gad na Ruben sịrị Mosis, “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu. 26 Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala Gilead. 27 Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọdan ibu agha nʼihu
28 Mgbe ahụ, Mosis nyere Elieza, bụ onye nchụaja, na Joshua nwa Nun, na ndịisi ezinaụlọ nke ebo Izrel niile iwu banyere ha, 29 Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo Gad na Ruben, onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọdan nʼihu
31 Ndị ebo Gad na Ruben zara sị, “Ihe ọbụla
33 Mosis nyere ndị ebo Gad, na Ruben, na ọkara Manase nwa Josef, alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị Bashan na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu.
34 Ndị ebo Gad wugharịrị ma wusiekwa obodo ndị a, Dibọn, Atarọt, Aroea 35 Atrọt-Shofan, Jeza, Jogbeha, 36 Bet-Nimra na Bet-Haran bụ obodo e wusiri ike, wukwaara igwe ewu na atụrụ ha ụlọ anụ nʼime ya. 37 Ma ndị ebo Ruben wugharịrị obodo ndị a: obodo Heshbọn, Eleale, Kiriatem, 38 Nebo na Baal-Meon (ma a gbanwere aha ha) na Sibma. Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ.
39 Ndị agbụrụ Makia, nwa Manase gara nʼobodo Gilead lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ. 40 Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ. 41 Jia, onye sikwa nʼebo Manase gara buso ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ agha, lụgbuo ha. Ọ gbanwere aha obodo nta ndị a, gụọ ha Havọt Jaịa. 42 Nʼoge a kwa, otu nwoke a na-akpọ Nọba duuru ndị agha gaa nʼobodo Kenat, na nʼobodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, lụgbuo ha, bichie nʼime ha. Ọ gbanwere aha obodo ndị ahụ niile bido ịkpọ ha Nọba, nke bụ aha ya onwe ya.
<- Ọnụọgụgụ 31Ọnụọgụgụ 33 ->-
a 32:12 Nkọwa e nyere banyere akwụkwọ Jenesis isi nke 15:19, nakwa nʼisi nke 36:11, mere ka anyị mata na ndị Keniz bụ ndị Kenan. Ha bụ ndị si nʼagbụrụ Ịsọ.