1
8 “Ọ bụ naanị ụmụ ndị ikom Erọn, ndị nchụaja ga-egbu opi ndị a. Nke a bụ iwu ga-adịgide nye unu site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ niile. 9 Mgbe unu gara ibu agha nʼala unu imegide onye iro na-akpagbu unu, fụọnụ opi ike. Nke a ga-eme ka
11 Nʼụbọchị iri abụọ, nʼime ọnwa nke abụọ, nʼafọ nke abụọ, igwe ojii ahụ biliri site nʼelu ụlọ nzute nke igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 12 Mgbe ahụ, ụmụ Izrel biliri ije site nʼọzara Saịnaị jegharịa site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu igwe ojii ahụ akwụsị nʼọzara Paran. 13 Nke a bụ njem mbụ ha mere dịka
14 Usuu ọmụma ụlọ ikwu nke ebo Juda buru ụzọ bulie ije a, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Nashọn, nwa Aminadab, bụ onyendu ha. 15 Netanel nwa Zua bụ onyendu usuu ebo Isaka. 16 Eliab nwa Helọn bụ onyendu usuu ebo Zebụlọn 17 Mgbe ahụ, e wedara ụlọ nzute ahụ. Ụmụ Geshọn na Merari buru ya, bilikwaa ije ha.
18 Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ruben biliri ije, nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elizọ nwa Shedeua bụ onyendu ha. 19 Shelumiel nwa Zurishadai bụ onyendu usuu ebo Simiọn. 20 Eliasaf nwa Deuel bụ onyendu usuu ebo Gad. 21 Mgbe ahụ, ụmụ Kohat ndị bu ihe nsọ ndị ahụ niile, biliri ije ha. Tutu ha erute, e guzobere ụlọ nzute ahụ nʼebe o kwesiri ịdị.
22 Usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Ifrem biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Elishama nwa Amihud bụ onyendu ha. 23 Gamaliel nwa Pedazo bụ onyendu usuu ebo Manase. 24 Abidan nwa Gidiọni bụ onyendu usuu ebo Benjamin.
25 Na ngwụsị usoro ahụ, usuu ọmụma ụlọ ikwu ebo Dan biliri ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai. 26 Pagịel nwa Okran bụ onyendu usuu ebo Asha. 27 Ahira nwa Enan bụ onyendu usuu ebo Naftalị. 28 Nke a bụ usoro usuu ụmụ Izrel si bilie ije ha.
29 Mosis gwara Hobab nwa Reuel,[a] nna nwunye ya onye Midia okwu sị, “Anyị ebiliela ije ịga ebe ahụ
30 Ma ọ zara sị, “E e, agaghị m eso unu. Ana m alaghachi nʼala nke aka m ịlaghachikwuru ụmụnna m.”
31 Ma Mosis zara sị ya, “Biko ahapụla anyị nʼihi na ị maara ebe anyị nwere ike kwụsị zuo ike nʼọzara. Ị ga-abụrụ anyị anya anyị ji ahụ ụzọ. 32 Ọ bụrụ na i soro anyị, anyị ga-ekenye gị ihe ọma ọbụla
33 Ya mere ha sitere nʼugwu
35 Mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ ahụ biliri ije, Mosis na-ekwu sị,
36 Ma mgbe ọbụla igbe ọgbụgba ndụ bịara ebe izuike, Mosis na-ekwukwa sị,
-
a 10:29 Ọpụ 2:18