1 Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, 2
3 Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas. 4 Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide Jisọs na nzuzo gbuo ya. 5 Ha kwekọrịta sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme ka ọgbaaghara hapụ ịdị nʼetiti ndị mmadụ.”
6 Mgbe Jisọs nọ na Betani, nʼụlọ Saimọn onye ekpenta, 7 otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri.
8 Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị, “Olee ụdị ịla nʼiyi dị nke a! 9 A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara ya nyere ndị ogbenye aka.”
10 Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nʼobi ha, ọ sịrị ha,
14 Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja. 15 Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. 16 Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha.
17 Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri Ngabiga?”
18 Ọ zara ha sị,
20 Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ. 21 Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị,
22 Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?”
23 Ma ọ zara ha sị,
25 Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?”
26 Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha,
27 Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha,
30 Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼUgwu Oliv.
31 Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị,
33 Pita sịrị, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị gbalaga, agaghị m ahapụ gị.”
34 Jisọs sịrị,
35 Ma Pita kwuru sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị ahụ niile na-eso ụzọ ya kwuru.
36 Mgbe Jisọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ Getsameni, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha,
39 Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị,
40 Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita,
42 Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị,
43 Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ. 44 Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ.
45 Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha,
47 Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi.[c] Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zitere ha. 48 Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!” 49 Ngwangwa o jekwuuru Jisọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ.
50 Jisọs gwara ya sị,
52 Ma Jisọs sịrị ya,
55 Nʼoge awa ahụ, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ sị,
57 Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nʼụlọ Kaịfas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zukọtara nʼebe ahụ. 58 Pita sogidere Jisọs nʼazụ site nʼebe dị anya. O rutere nʼobi onyeisi nchụaja, baa nʼime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwe ike ịhụ otu ihe a ga-esi bie.
59 Ndịisi nchụaja, na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ahụ nọ na-achọ ama ụgha megide Jisọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. 60 Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara.
62 Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?” 63 Ma Jisọs ekwughị ihe ọbụla.
64 Jisọs gwara ya sị,
65 Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya? 66 Gịnị bụ mkpebi unu?”
67 Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra, 68 sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?”
69 Mgbe ahụ Pita nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”
70 Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.”
71 Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na Jisọs onye Nazaret nọkọrọ.”
72 Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.”
73 Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere Pita sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.”
74 Ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a.”