1
5 Mosis gwara ọgbakọ ahụ sị, “Nke a bụ ihe
10 Mgbe ahụ, Mosis weere mmanụ nsọ ahụ tee nʼụlọ nzute ahụ, na nʼihe niile dị nʼime ya, ido ha nsọ. 11 Ọ fesakwara ụfọdụ nʼime mmanụ ahụ ugboro asaa nʼebe ịchụ aja, fesakwa ya ugboro asaa nʼelu ngwongwo niile dị nʼebe ịchụ aja, na nʼefere e ji asa ihe, na ụkwụ ya, ido ha nsọ. 12 Ọ wụsara Erọn ụfọdụ mmanụ nsọ ahụ nʼisi, tee ya mmanụ, nʼihi ido ya nsọ. 13 Ọ kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, o yikwasịrị ha uwe ime ahụ, kee ha ihe okike nke ukwu, kekwasị ha ihe okike nʼisi, dịka iwu
14 Ọ kpụtara oke ehi e ji achụ aja mmehie, mee ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasị aka ha nʼelu isi ya. 15 Mosis gburu oke ehi ahụ, were ụfọdụ nʼime ọbara ahụ, jiri mkpịsịaka ya rụta ọbara tee na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja, ido ebe ịchụ aja ahụ nsọ. Ọ wụpụrụ ọbara nke fọdụrụ nʼụkwụ ala ala nke ebe ịchụ aja ahụ. Otu a ka o si doo ya nsọ, ikpuchiri ya mmehie. 16 Mosis wekwara abụba niile dị gburugburu ihe dị nʼime afọ ehi ahụ, mba-umeju nke umeju ya, akụrụ abụọ ya na abụba dị nʼelu ha, kpọọ ya ọkụ nʼebe ịchụ aja. 17 Ma oke ehi ahụ, akpụkpọ ya, anụ ya na mgbịrị afọ ya, ka ọ kpọrọ ọkụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu ahụ dịka
18 O weere ebule ahụ, chee nʼihu
22 O kpụpụtara ebule nke ọzọ, bụ ebule nke ido nsọ, Erọn na ụmụ ya ndị ikom bikwasịrị aka ha nʼelu isi ya. 23 Mgbe ahụ, Mosis gburu ya, were ụfọdụ nʼime ọbara ya tee Erọn nʼọnụ ntị aka nri, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ya, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ya. 24 Mosis kpọtara ụmụ ndị ikom Erọn nso, weere ụfọdụ ọbara ahụ tee nʼọnụ ntị aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ aka nke aka nri ha, na nʼisi mkpụrụ ụkwụ nke aka nri ha. O fesakwara ọbara nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ. 25 O weere abụba ya, akụkụ ọdụdụ ya nwere abụba, na abụba niile nke kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na mba-umeju nke dị nʼumeju ya, akụrụ ya abụọ na abụba ha, na apata aka nri ya 26 O sitere na nkata achịcha ahụ a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, nke dị nʼihu
30 Mgbe ahụ, Mosis weere ụfọdụ nʼime mmanụ nsọ ahụ, na ụfọdụ nʼime ọbara ahụ dị nʼebe ịchụ aja fesa ya Erọn na uwe ya, fesakwa ya ụmụ ndị ikom Erọn nʼuwe ha. Otu a ka o si doo Erọn na uwe ya, na ụmụ ya ndị ikom na uwe ha nsọ.
31 Mgbe ahụ, Mosis gwara Erọn na ụmụ ya ndị ikom sị, “Sienụ anụ ahụ nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Nọrọkwanụ nʼebe ahụ rie ya na achịcha ahụ dị nʼime nkata onyinye ido nsọ, dịka a gwara m, sị, ‘Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eri ya.’ 32 Ihe ọbụla fọdụrụ na anụ ahụ na achịcha ahụ, ka unu ga-akpọ ọkụ.” 33 Ọ sịrị ha: “Unu esikwala nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute a pụọ ruo ụbọchị asaa, tutu ruo mgbe ụbọchị ido nsọ unu zuruoke, nʼihi na ido nsọ unu ga-anọ ụbọchị asaa. 34 Ihe niile e mere nʼụbọchị taa bụ ihe
36 Ya mere, Erọn na ụmụ ya ndị ikom mezuru ihe niile dịka