1 Mgbe Jabin eze Hazọ nụrụ nke a, o ziri ozi zigara Jobab eze ndị Madọn, zigakwara ndị eze obodo Shịmrọn na Akshaf, 2 na ndị eze bi nʼobodo ugwu ugwu, na ndị bi nʼime Araba, na ndịda Kineret, na ndagwurugwu ọdịda anyanwụ, na nʼime Nafọt Doa, nke dị nʼọdịda anyanwụ, 3 zigakwara eze ndị Kenan ndị bi nʼọwụwa anyanwụ, na ọdịda anyanwụ, zigakwara eze ndị Amọrait, na eze ndị Het, na eze ndị Periz, na nke ndị Jebus nke dị nʼala ugwu. O zigakwara eze ndị Hiv ndị bi na ndịda Hemon, na mpaghara Mizpa. 4 Ndị eze a niile kwekọrịtara chịkọtaa ndị agha ha niile nʼotu. Ndị agha ha chịkọtara dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. Ha ji ọtụtụ ịnyịnya na ọtụtụ ụgbọ agha. 5 Eze ndị a niile zukọrọ maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ mmiri Merọm, maka ibuso Izrel agha.
6 Ma
7 Ya mere, Joshua na ndị agha ya niile bịaruru akụkụ mmiri Merọm na mberede, lụso ha agha. 8
10 Mgbe ahụ, Joshua laghachiri azụ busoo Hazọ agha merie ya, were mma agha gbuo eze ya, nʼihi na Hazọ bụrịị isi obodo alaeze ahụ niile. 11 Ha ji mma agha gbuo ndị niile bi nʼobodo ahụ, bibie ha kpamkpam, ọ dịghị onye a hapụrụ nke na-eku ume. O sukwara Hazọ ọkụ.
12 Joshua weere obodo niile nke ndị eze ahụ na ndị eze ha niile,[a] jiri mma agha gbuchapụ ha. Ọ lakwara ha niile nʼiyi, dịka Mosis onyeozi
16 Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile, bụ ala ugwu ugwu ahụ, na ala Negeb, na ala Goshen, na obosara ala ọdịda anyanwụ ahụ niile, na ala Araba, na ala ugwu ahụ niile, na ala ahụ dị na mgbada ugwu Izrel. 17 Nʼihi nke a, ala ndị Izrel nwere gbasara nʼụzọ niile site nʼugwu Halak, nke dị nso na Sia, ruo Baal-Gad nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn, na ndịda ugwu Hemon. Joshua jidere ma gbukwaa ndị eze ndị ala ahụ niile. 18 O were Joshua ogologo oge imeri obodo ndị a niile na eze ha nʼagha. 19 Ọ dịkwaghị obodo ọzọ e mere ka ha na ụmụ Izrel dị nʼudo karịa naanị ndị Hiv, ndị bi na Gibiọn. Obodo ndị ọzọ niile ka a lara nʼiyi. 20 Nʼihi na ọ bụ
21 Nʼoge ahụ kwa, Joshua gara kpochapụ ndị Anak ahụ bi nʼala ugwu ugwu, ya bụ, na Hebrọn, na Debịa, na Anab, na ala ugwu ugwu Juda, na ala ugwu ugwu Izrel. O gburu ha niile, laa obodo ha nʼiyi. 22 Ọ dịkwaghị otu onye Anak a hapụrụ ndụ nʼoke ala Izrel niile, karịakwa ndị fọdụrụ na Gaza, na Gat, na nʼime Ashdọd.
23 Ya mere, Joshua meriri ala ahụ niile dịka
-
a 11:12 Dit 7:2; 20:16