1 Zedekaya gbara iri afọ abụọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị dị ka eze na Jerusalem afọ iri na otu. Aha nne ya bụ Hamutal nwa Jeremaya, onye Libna. 2 O mere ihe jọrọ njọ nʼanya
4 Nʼihi ya, nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya, nʼụbọchị nke iri nʼọnwa nke iri, nke afọ ahụ, Nebukadneza, eze Babilọn, duuru usuu ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha. Ha mara ụlọ ikwu ndị agha nʼazụ obodo ahụ, wuokwa mgbidi nnọchibido gburugburu obodo ahụ. 5 Anọchibidoro obodo a nʼagha ruo nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị eze Zedekaya.
6 Nʼabalị nke itoolu, nke ọnwa anọ nʼafọ ahụ, oke ụnwụ siri ike dị nʼobodo ahụ ruo na ọ dịkwaghị nri dị nke ndị mmadụ ga-eri. 7 Mgbe ahụ, e tipuru oghere nʼaja mgbidi obodo ahụ, ndị agha niile ji abalị gbapụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, nʼagbanyeghị na ndị Babilọn[a] nọ obodo ahụ gburugburu. Ha gbapụrụ chee ihu nʼụzọ Araba.[b] 8 Ma usuu ndị agha Babilọn[c] chụsoro Zedekaya bụ eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya, 9 e jide ya.
12 Nʼụbọchị nke iri, nʼọnwa nke ise, nke afọ iri na itoolu, nke ọchịchị Nebukadneza eze Babilọn, Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze, onye na-ejere eze Babilọn ozi, bịarutere Jerusalem. 13 O sunyere ụlọnsọ
17 Ma ndị Babilọn tipịara ogidi bronz niile, ha na ihe ndọkwasị niile na Oke osimiri bronz ndị ahụ dị nʼụlọnsọ
20 O burukwara bronz sitere nʼogidi abụọ ahụ, oke Osimiri ahụ na ehi iri na abụọ e ji bronz kpụọ, bụ nke dị nʼokpuru ya, na ihe ndọkwasị ya niile, nke eze bụ Solomọn mere nʼihi ụlọnsọ
24 Ọchịagha ndị nche eze ahụ, kpụụrụ Seraya, onyeisi nchụaja, na Zefanaya, bụ onye nchụaja na-esote ya nʼọkwa, na ndị nche atọ na-eche ọnụ ụzọ mbata dịka ndị mkpọrọ. 25 O sitere nʼetiti ndị ahụ fọdụrụ nʼobodo kpụụrụ otu onyeisi na-ahụ maka ndị agha, na ndị ikom asaa na-enye eze ndụmọdụ. O kpukwaara ode akwụkwọ, onye isi ọrụ na-ahụ maka ịmanye ndị ga-aga agha, jidekwa iri ndị ikom isii bụ ndị a hụrụ nʼime obodo ahụ. 26 Nebuzaradan, bụ ọchịagha kpụụrụ ha niile, dute ha nʼihu eze Babilọn na Ribla. 27 Nʼebe ahụ na Ribla, dị nʼobodo Hamat, ka eze nọ nye iwu ka e gbuo ha niile.
31 Nʼafọ nke iri atọ na asaa, site na mgbe e mere ka Jehoiakin eze Juda gaa biri nʼala ọzọ, nʼafọ Awel-Maduk ghọrọ eze Babilọn. Mgbe ahụ, o mere ka Jehoiakin eze Juda, si nʼụlọ mkpọrọ pụta, nwere onwe ya. O mere nke a nʼụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa iri na abụọ. 32 Ọ gwara ya okwu ọma, nyekwa ya ọnọdụ ugwu dị elu karịa ọnọdụ ndị eze ndị ọzọ niile ha na ya nọ na Babilọn. 33 Nʼihi nke a, Jehoiakin gbanwere uwe mkpọrọ ya, wezuga ya. Sitekwa nʼoge ahụ tutu ruo mgbe ọ nwụrụ, ya na eze na-erikọ nri. 34 Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, eze Babilọn na-enye Jehoiakin oke ihe ruru ya kwa ụbọchị niile nke ọ dị ndụ, ruokwa nʼụbọchị ọnwụ ya.
-
a 52:7 Maọbụ, Kaldịa
b 52:7 Ya bụ ndagwurugwu Jọdan
c 52:8 Kaldịa dịkwa nʼamaokwu nke 14 na 17
d 52:16 Ya bụ ndị dakarịsịrị nʼogbenye
e 52:21 Iri nzọ ụkwụ abụọ na asaa
f 52:21 Nzọ ụkwụ iri na asatọ
g 52:22 Ya bụ nzọ ụkwụ asaa na ọkara
Languages