51
1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,
“Lee, aga m akpali mmụọ onye mbibi,
ka ọ bịa megide Babilọn na ndị bi na Kaldịa.
2 Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn,
ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya.
Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile,
nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya.
3 Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya,
ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya.
Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ,
kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam.
4 Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn,
ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.
5 Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma,
nʼihu Onye nsọ nke Izrel,
ma Chineke bụ Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile
agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ.
6 “Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ.
Gbasienụ ọsọ ike nʼihi ndụ unu.
Unu ekwela ka e bibie unu nʼihi mmehie ya.
Oge ịbọ ọbọ Onyenwe anyị eruola,
ọ ga-akwụghachi ya ihe ruuru ya.
7 Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị .
O mere ka ụwa niile si nʼiko ahụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke.
Mba niile nke ụwa ṅụrụ mmanya ya.
Ugbu a ha niile na-ayị ara.
8 Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya.
Kwasierenụ ya akwa ike.
Wetanụ ọgwụ tee ya,
ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma.
9 “ ‘Anyị gaara agwọ Babilọn,
ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta.
Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị,
nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe.
Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’
10 “ ‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè.
Ka anyị kwupụta
ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’
11 “Mụọnụ ọnụ àkụ unu;
bulienụ ọta unu!
Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia,
nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi.
Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ,
ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ.
12 Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn.
Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne
Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya.
Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha,
nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo,
bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn.
13 Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri,
ndị nwere akụnụba dị ukwuu,
ọgwụgwụ unu abịaruola.
Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu.
14 Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị,
Nʼezie, aga m eme ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ga-aha ka igurube jupụta nʼime gị.
Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ megide gị.
15 “O sitere nʼike ya mee ụwa;
ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya,
ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
16 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa.
Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie.
Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo,
na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya na-ewepụta ifufe.
17 “Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ.
Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ.
Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ;
ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
18 Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo,
mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
19 Ma onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a,
nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile,
tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya.
Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
20 “Ị bụ mkpọrọ osisi m ji ebu agha,
na ngwa agha m ga-eji gaa nʼihu agha.
Gị ka m ga-eji tipịa mba niile dị iche iche,
gị ka m ga-eji laa alaeze niile nʼiyi;
21 gị ka m ga-eji tipịa ịnyịnya na onye na-agba ya,
gị ka m ga-eji tipịa ụgbọ agha na onye na-anya ya;
22 gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị,
gị ka m ga-eji tipịa agadi nwoke na okorobịa,
gị ka m ga-eji tipịa okorobịa na nwaagbọghọ,
23 gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya,
gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya;
gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze.
24 “Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.
25 “Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe,
gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
“Aga m esetipụ aka m megide gị,
kwapụ gị site na nkume dị elu.
Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ.
26 A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ,
maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla,
nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
27 “Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ.
Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile.
Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya;
kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya:
Ararat, na Mini, na Ashkenaz.
Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya;
ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube.
28 Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha,
kwadoonụ ndị eze Midia,
na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị,
na mba niile nke ha na-achị.
29 Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu,
nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu.
Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu,
ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya.
30 Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ;
ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike.
Ike agwụla ha;
ha adịla ka ndị inyom.
E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ,
tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.
31 Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya,
otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ;
ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya
na a dọtala obodo ya nʼagha,
32 na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi,
na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ,
na ndị agha niile na-amakwa jijiji.”
33 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru,
“Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka,
nʼoge a na-azọcha ya.
Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.”
34 “Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị,
o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya.
O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya.
O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ,
jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya.
Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.
35 Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.”
Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru.
Jerusalem na-ekwukwa sị,
“Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.”
36 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị,
bọtakwara gị ọbọ.
Aga m emekwa ka osimiri taa,
meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa.
37 Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe,
ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa,
bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha,
na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa.
38 Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm,
ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara.
39 Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha,
aga m edo oriri nʼihu ha.
Aga m eme ka ha ṅụbiga mmanya oke,
si otu a mee ka ha jiri oke ịchị ọchị tie mkpu ọṅụ.
Nʼikpeazụ, ha ga-arahụ ụra ebighị ebi, nke ha na-agaghị esite na ya bilie.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
40 “Aga m akpụdata ha,
dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu,
dịka ebule na mkpi.
41 “Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha,
jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha.
Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu
nʼetiti mba niile!
42 Osimiri ga-eri Babilọn,
mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya.
43 Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu,
ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara,
ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya,
nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee.
44 Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ,
mee ya ka ọ gbọpụta ihe ndị ahụ o loro.
Mba dị iche iche agakwaghị agakwurukwa ya ọzọ.
Mgbidi Babilọn ga-adakwa.
45 “Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m!
Gbapụnụ ọsọ nʼihi ndụ unu.
Gbapụnụ ọsọ site nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị .
46 Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ,
mgbe unu nụrụ akụkọ dị iche iche nʼala ahụ.
Nʼihi na otu ụdị akụkọ ka a ga-anụ nʼafọ a, akụkọ ọzọ dị iche ka a ga-anụkwa nʼafọ nke ọzọ.
A ga-anụ akụkọ iwusi ọbara nʼala ahụ,
nụkwa akụkọ onye ọchịchị nke na-ebuso onye ọchịchị ọzọ agha.
47 Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa
mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ.
A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile.
Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya,
48 mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha
ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn.
Ndị ga-ebuso ya agha
ga-esitekwa nʼugwu bịa.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
49 “Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu,
dịka ndị niile e gburu nʼụwa
si daa site nʼaka ndị Babilọn.
50 Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ,
wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala.
Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya,
na-echetakwa Jerusalem.”
51 “Ihere emeela anyị,
nʼihi na a kparịala anyị.
Ihere ekpuchiekwala ihu anyị,
nʼihi na ndị mba ọzọ abatala
nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị .”
52 “Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,
“mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ.
Ndị e merụrụ ahụ
ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile.
53 A sịkwarị
[a] na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe,
ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa,
aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
54 “Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta,
ụzụ oke ịla nʼiyi
sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta.
55 Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi.
Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị.
Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri,
mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu.
56 Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha.
A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha,
gbajisiekwa ụta ha niile.
Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi;
ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya.
57 Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke;
aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ.
Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.”
Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ
Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile.
58 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,
“A ga-akwada mgbidi Babilọn nke sara mbara, mee ka ọ daruo ala,
a ga-eji ọkụ sunye nʼọnụ ụzọ ama ya niile dị elu.
Ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.
Ndọgbu nʼọrụ nke mba niile dị iche iche ga-abụ nkụ a na-akwanye nʼọkụ.”
59 Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya. 60 Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn. 61 Ọ sịrị Seraya, “Mgbe i ruru Babilọn, lezie anya hụ na ị gụpụtara okwu ndị a niile ebe ndị mmadụ ga-anụ ya. 62 Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị , gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’ 63 Mgbe ị gụsịrị ihe dị nʼakwụkwọ a, kegide ya nkume, tụnye ya nʼetiti iyi ukwu Yufretis. 64 Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka Babilọn ga-esi mikpuo. Ọ gaghị ebilikwa ọzọ, nʼihi ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ya. Ndị ya ga-adakwa.’ ”
Ebe a ka okwu Jeremaya niile gwụrụ.
<- Jeremaya 50 Jeremaya 52 ->
ReflectTheSON aims to make the Bible available worldwide, especially in nations that declare the Bible illegal.