5
O nweghị onye na-eme ezi ihe
1 “Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem,
legharịa anya, ma mara,
chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile.
Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye,
bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu.
M ga-agbagharakwa obodo a
2 Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’
ma ha ka na-aṅụ iyi nʼokwu ụgha.”
3 Onyenwe anyị , anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ?
Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ.
I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị.
Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume,
ha ajụla ịchịgharị.
4 Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenye
na ndị na-enweghị uche,
ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ Onyenwe anyị ,
na iwu nke Chineke ha.
5 Aga m ejekwuru ndị ndu,
gwa ha okwu sị,
nʼezie ha maara ihe gbasara ụzọ Onyenwe anyị ,
marakwa iwu niile nke Chineke ha.”
Ma ha onwe ha nʼotu obi agbajiela ịyagba ahụ,
tijiekwa agbụ niile.
6 Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ;
nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha.
Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha
ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta.
Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu,
na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.
7 “Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu?
Lee na ụmụ unu ahapụla m,
na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi.
Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha,
ma ha nọgidere na-akwa iko.
Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ.
8 Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya.
Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.
9 Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị,
m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?
M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ
megide mba dị otu a?”
10 “Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya,
ma unu emebila ya kpamkpam.
Gbajisienụ alaka ya
nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị .
11 Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda
egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
12 Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị .
E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme!
Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị;
mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.
13 Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku,
nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha.
Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”
14 Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka
“Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta,
aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ.
Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa.
15 Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,
“Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu.
Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike,
nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha,
ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha.
16 Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe;
ha niile bụkwa ndị dike nʼagha.
17 Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere.
Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị.
Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu.
Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu.
Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike,
bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.
18 “Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka
20 “Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya,
kwusaa ya na Juda.
21 Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche,
unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ,
na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe.
22 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị,
o kwesighị ka unu tụọ m egwu?”
“O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m?
Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere.
Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe.
Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya.
Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.
23 Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe.
Ha atụgharịala wezuga onwe ha.
24 Ha adịghị asị onwe ha,
‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị,
onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya,
ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’
25 Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka.
Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu.
26 “E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m,
ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya,
dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.
27 Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya,
ụlọ ndị dị otu a jupụtara nʼaghụghọ.
Nʼihi nke a, ha ghọrọ ndị ọgaranya na ndị dị ike,
28 ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ.
Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ;
ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi.
Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna;
ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha.
29 M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?”
ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ.
“M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ
megide mba dị otu a?
30 “Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke
emeela nʼala a.
31 Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha,
ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike,
ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya.
Languages