1 Mgbe oge nta gasịrị site nʼoge Nebuzaradan ọchịagha ndị nche nọ na Rema mere ka Jeremaya nwere onwe ya, okwu
7 Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ, 8 ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha. 9 Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn:[a] birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma. 10 Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.”
11 Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile, 12 ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ.
13 Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa 14 sị ya, “Ọ bụ na i maghị na Baalis eze ndị Amọn ezitela Ishmel nwa Netanaya ka ọ bịa gbuo gị?” Ma Gedaliya nwa Ahikam ekwetaghị na ọ bụ eziokwu ka ha na-ekwu.
15 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya pụrụ na nzuzo jekwuru Gedaliya na Mizpa sị ya, “Biko, kwere ka m gaa gbuo Ishmel nwa Netanaya. O nweghị onye ga-amata otu o si nwụọ. Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji gbuo gị, ime ka ndị Juu niile na-alọghachikwute gị gbasasịakwa ọzọ, na imekwa ka ndị Juda fọdụrụ laa nʼiyi?”
16 Ma Gedaliya nwa Ahikam zara Johanan nwa Kariya sị ya, “Biko, emela ihe dị otu ahụ! Nʼihi na ihe ị na-ekwu banyere Ishmel abụghị eziokwu.”
<- Jeremaya 39Jeremaya 41 ->-
a 40:9 Ya bụ, Kaldịa