30
Nlọta ụmụ Izrel
1 Ndị a bụ okwu nke sị nʼebe 
4 Ma ndị a bụ okwu 
“ ‘A na-anụ mkpu akwa sitere nʼegwu, 
nke oke egwu, ọ bụghị udo. 
 6 Jụọnụ ajụjụ, ma hụ, 
nwoke ọ pụrụ ịmụ ụmụ? 
Gịnịkwa mere m ji na-ahụ ndị ikom dị ike 
ka ha tụkwasịrị aka ha nʼukwu ha dịka nwanyị ime na-eme, 
ihu onye ọbụla gbanwekwara dịka nke onye na-anwụ anwụ? 
 7 Ụbọchị dị oke egwu ka ụbọchị ahụ ga-abụ. 
O nwekwaghị ụbọchị ga-adị ka ya. 
Ọ ga-abụ oge oke nsogbu nye Jekọb, 
ma a ga-anapụta ya site na ya. 
 8 “ ‘Nʼụbọchị ahụ,’ 
‘aga m agbaji ihe ịnya nʼolu a nyakwasịrị ha nʼolu, 
tibisikwaa agbụ niile e kere ha. 
Ha agaghị abụkwa ndị ohu nye ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri. 
 9 Kama ha ga-efe Onyenwe anyị  bụ Chineke ha, 
na Devid eze ha, 
onye m ga-esi nʼetiti ha mee ka o biliere ha. 
 10 “ ‘Ya mere, atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. 
Atụkwala ụjọ[a] gị Izrel,’ 
Otu a ka Onyenwe anyị  kwupụtara. 
‘Aghaghị m ịzọpụta gị site na mba ahụ dị anya, 
zọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site na mba ahụ e mere ka ha gaa biri nʼime ya. 
Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo na nchebe. 
Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ụjọ tụọ ya ọzọ. 
 11 Nʼihi na mụ onwe m nọnyeere gị, aga m azọpụtakwa gị,’ 
otu a ka Onyenwe anyị  kwubiri. 
‘A sịkwarị na m alaa mba ndị ahụ niile nʼiyi, 
bụ mba ndị ahụ m chụbanyere gị nʼime ha, 
agaghị m ebibi gị onwe gị kpamkpam. 
Aga m adọ gị aka na ntị maọbụ dịka o kwesiri,[b] 
ị gaghị agbanarị ịta ahụhụ.’
12 “Ihe ndị a ka 
“ ‘Ọnya dị gị nʼahụ enweghị ngwọta, 
mmerụ ahụ i merụrụ dị ukwuu, ọ pụghị ịla ala. 
 13 O nweghị onye na-ekpechitere gị ọnụ gị, 
o nweghị ọgwụ dị nke e ji eme ka ọnya gị laa. 
Olileanya adịghị na a ga-agwọ gị. 
 14 Ndị niile gị na ha dị na mma e chezọọla gị; 
ha adịghị echetakwa gị nʼechiche uche ha. 
E tieela m gị ihe dịka onye iro gị ga-esi tie gị ihe; 
ataala m gị ahụhụ dịka onye na-enweghị obi ebere ga-esi taa gị ahụhụ, 
nʼihi na ajọ omume gị bara ụba nke ukwuu, 
mmehie gị dịkwa ọtụtụ. 
 15 Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ọnya dị gị nʼahụ? 
Gịnị mere i ji na-akwa akwa nʼihi ihe mgbu nke na-enweghị ọgwụgwọ? 
Emere m ka ihe ndị a bịakwasị gị nʼihi ịba ụba nke ajọ omume gị, 
na nʼihi ọtụtụ mmehie gị. 
 16 “ ‘Ma a ga-erepịa ndị niile na-eripịa gị; 
ndị iro gị niile, ha niile nʼotu nʼotu, ka a ga-adọta nʼagha buru gaa mba ọzọ. 
Ndị na-apụnara gị ihe i nwere nʼike ka a ga-apụnarakwa ha ihe ha nwere nʼike. 
Ndị niile na-alụtakwa ihe inwere nʼagha ka a ga-enye ka ha ghọọ ihe nlụta nʼagha. 
 17 Ma aga m eme ka ahụ sie gị ike; 
aga m agwọkwa ọnya gị niile,’ otu a ka Onyenwe anyị  kwubiri ya. 
‘Nʼihi na a na-akpọ gị onye a jụrụ ajụ. 
Gị Zayọn, nke o nweghị onye na-elekọta ya.’
18 “Otu a ka 
“ ‘Lee, ana m aga ime ka Jekọb nwetaghachi ụlọ ikwu[c] ya; 
aga m enwekwa obi ebere nʼebe obibi ya. 
A ga-ewugharị obodo ahụ nʼelu mkpọmkpọ ebe ya;[d] 
ụlọeze ga-eguzokwa nʼọnọdụ kwesiri ya. 
 19 Nʼebe ahụ ka a ga-esi na-anụ olu abụ ekele, 
na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ. 
Aga m eme ka ha baa ụba nʼọnụọgụgụ, 
ha agaghị adịkwa ole na ole. 
Aga m eme ka ha bụrụ ndị a na-asọpụrụ, 
ndị a na-agaghị eledakwa anya. 
 20 Ụmụ ha ga-adịkwa ka ụmụntakịrị ndị mgbe ochie ahụ, 
nzukọ ha ga-eguzosikwa ike nʼihu m. 
Aga m atakwa ndị ahụ na-emegbu ha ahụhụ. 
 21 Onyendu ha ga-abụ otu onye nʼime ndị ha; 
onye ga-achị ha ga-esi nʼetiti ha pụta. 
Aga m akpọbata ya nso ebe m nọ, ọ ga-abịaru m nso, 
nʼihi na olee mmadụ ahụ nke pụrụ inyefe onwe ya kpamkpam, 
maka ịbịaru m nso?’ 
Otu a ka Onyenwe anyị  kwubiri. 
 22 ‘Nʼụzọ dị otu a unu ga-abụ ndị m, 
mụ onwe m kwa ga-abụ Chineke unu.’ ” 
 23 Lee, Onyenwe anyị  ga-esite nʼọnụma ya 
mee ka oke ifufe ya fee. 
Ọ ga-efekwasị ndị na-emebi iwu 
dịka ifufe na-efesi ike. 
 24 Iwe ọkụ Onyenwe anyị  agaghị akwụsị 
tutu ruo mgbe o mezuru 
ihe ndị o bu nʼobi. 
Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa 
Languages