1 Samsin gbadara nʼobodo Timna[a] ebe ọ hụrụ otu nwaagbọghọ onye Filistia. 2 Mgbe ọ lọtara nʼụlọ, ọ gwara nne na nna ya, “Ahụrụ m otu nwanyị nʼime Timna[b] sitere nʼụmụ ndị inyom Filistia; ugbu a, lụtara m ya na nwunye.”
3 Nne na nna ya zara ya, “Ọ bụ na ọ dịghị nwanyị dị nʼetiti ndị inyom ụmụnne gị, maọbụ nʼetiti ndị anyị niile? Gịnị mere o ji bụrụ nʼetiti ndị Filistia a na-ebighị ugwu ka i si lụtara onwe gị nwunye?”
5 Samsin na nne na nna ya gawara obodo Timna maka ọlụlụ nwanyị a. Mgbe ha na-erute ubi vaịnị dị obodo Timna nso, otu[c] nwa ọdụm sitere nʼọhịa mapụta, gbọrọ ụja na-abịakwute Samsin. 6 Nʼotu oge ahụ, Mmụọ
8 Ọ laghachiri mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị ka ọ kpọrọ ya. Ma mgbe ọ tụgharịrị ka ọ hụ ozu ọdụm ahụ, ọ hụrụ na igwe aṅụ bizi nʼime ozu ọdụm ahụ, na-emepụtakwa mmanụ aṅụ. 9 Ọ kọpụtara mmanụ aṅụ ahụ tinye nʼaka ya, malite ịracha ka ọ na-aga nʼụzọ. Mgbe ọ bịakwutere nne na nna ya, o nyebinyere ha ụfọdụ, ha onwe ha rachakwara ya. Ma ọ gwaghị ha na o wetara ya site nʼozu ọdụm.
10 Nna ya gara ịhụ nwanyị ahụ ma Samsin kpọkọtara ụmụ okorobịa obodo ahụ meere ha oriri dịka omenaala ha sị di. 11 Mgbe Samsin rutere, a kpọnyere ya ndị bịara mmemme ọnụọgụgụ ha dị iri atọ.
12 Mgbe ahụ, Samsin gwara ha okwu sị ha, “O nwere ajụjụ, gwa m, gwa m, gwa m, m chọrọ ka unu kọwaara m. Ọ bụrụ na unu enwee ike kọwaa ya, site taa ruo nʼụbọchị asaa nke mmemme a, aga m enye unu iri uwe mwụda atọ, nyekwa unu iri uwe mwụda atọ ọzọ akpara akpa. 13 Ọ bụrụkwanụ na unu enweghị ike kọwaa ya, unu ga-enye m iri uwe mwụda atọ, na iri uwe mwụda atọ akpara akpa.”
14 Ọ gwara ha sị,
15 Ma nʼụbọchị nke anọ, ha jekwuuru nwunye Samsin gwa ya okwu sị, “Chọọ ụzọ rafụta di gị ọnụ, ka ọ gwa gị ihe okwu a pụtara. Ma ọ bụghị ya, anyị ga-akpọ gị na ezinaụlọ nna gị ọkụ. Ọ bụ ịnapụ anyị ihe anyị nwere ka unu ji kpọọ anyị oku bịa nʼebe?”
16 Mgbe ahụ nwunye Samsin buuru onwe ya tụọ nʼelu ahụ ya, nʼebe akwa, sị, “Ị kpọrọ m asị! Nʼezie, ị hụghị m nʼanya. Ị tụụrụ ndị m ilu, ma ị gwaghị m ọsịsa ya.”
18 Ma tupu anwụ adaa nʼụbọchị nke asaa ahụ, ndị ikom obodo ahụ sịrị ya,
19 Otu mgbe ahụ kwa, Mmụọ
Languages