5
Abụ banyere ubi vaịnị a gbara ogige
1 Aga m abụ abụ nye onye m hụrụ nʼanya,
abụ banyere ubi vaịnị ya.
Onye m hụrụ nʼanya nwere ubi ya
nʼelu ugwu nta nke bụ ezi ala.
2 O gwuzere ya, wepụsịa okwute niile dị nʼime ya,
werekwa mkpụrụ vaịnị mara mma kụọ nʼime ya.
O wuru ụlọ nche nʼetiti ya,
sitekwa na nkume wapụtakwa ebe ịzọcha mmanya.
Emesịa, ọ nọdụrụ chere oge owuwe ihe ubi.
Mgbe oge ahụ ruru, ọ chọpụtara na nʼọnọdụ mkpụrụ vaịnị mara mma, ọ bụ ndị jọrọ njọ mịrị.
3 “Ugbu a, ndị ikom Jerusalem na Juda, unu anụla ihe mere.
Kpebienụ ikpe a dị nʼetiti mụ na ubi vaịnị m.
4 Olee ihe ọzọ m gaara emere ya
karịa ihe m mere?
Gịnị mere ubi vaịnị m ji mịara m mkpụrụ jọrọ njọ
nʼọnọdụ mkpụrụ na-atọ ụtọ?
5 Ugbu a, lee,
ihe m na-aga ime ubi vaịnị m a.
Aga m ewepụ ihe mgbochi a gbara ya,
hapụ ya ka ọ ghọọ ebe anụ ụlọ na-ata nri.
Aga m etida mgbidi ya
hapụ ya ka ọ bụrụ ebe a na-azọtọ ụkwụ.
6 Agaghị m akwachakwa ya ọzọ.
Agakwaghị m egwuru ya ala,
aga m ahapụ ya ka ogwu na uke too nʼime ya.
Aga m enyekwa igwe ojii iwu
ka mmiri ghara izokwasị ya ọzọ.”
7 Ubi vaịnị nke Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile,
bụ mba Izrel
na ndị Juda,
ha bụ vaịnị ahụ nke nʼatọ obi ya ụtọ.
Ma o lere anya ikpe ziri ezi, ma ihe ọ hụrụ bụ iwusi ọbara.
O lere anya ezi omume, ma ihe ọ nụrụ bụ mkpu akwa ndị a na-emegbu emegbu.
Ahụhụ na ikpe ọmụma
8 Ahụhụ dịrị unu ndị na-azụkọta ala
ma ndị ọzọ ahụghị ebe ha ga-ebi,
unu ndị na-ewu ụlọ na-ewukwasị ụlọ nʼala buru ibu,
ime ka ọ bụrụ naanị unu bi nʼụwa.
9 Ma
“Nʼezie, ọtụtụ ụlọ mara mma ga-atọgbọrọ nʼefu,
ụlọ ukwu mara mma ndị nwe ha agaghị anọkwa.
10 Ubi vaịnị ahụ a ga-eji ehi abụọ kọọ ụbọchị iri ga-ewepụta naanị ihe nwere ike iru galọọnụ mmanya isii,
ma ọka a kọrọ, nke ruru akpa ọka atọ ga-amịpụta ihe ruru otu akpa nʼọkara.”
11 Ahụhụ ga-adịrị unu niile ndị na-ebili nʼisi ụtụtụ
ịgbaso mmanya.
Ndị na-amụgide anya abalị
tutu ruo mgbe ha ṅụbigara mmanya oke.
12 Unu na-eji ụbọ akwara dị iche iche na une,
na ihe iti egwu na opi, na mmanya na-eme onwe unu obi ụtọ nʼoge mmemme oriri unu,
ma unu na-elelị Onyenwe anyị anya;
unu adịghịkwa asọpụrụ akaọrụ ya.
13 Nʼihi ya, ndị m ga-eje biri na mba ọzọ,
nʼihi amaghị ihe;
ndị ọkwa ha dị elu ga-anwụ nʼihi agụụ,
ndị mmadụ efu ga-abụ ndị akpịrị ga-akpọ nkụ nʼihi agụụ mmiri.
14 Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara,
ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke;
ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo,
tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke.
15 Nʼụbọchị ahụ, a ga-eweda nʼala ndị dị elu,
na ndị dị ala,
ndị mpako ka a ga-eweda nʼala.
16 Ma Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile, nwee ọnọdụ dịkarịsịrị elu, nʼihi ikpe ikpe ziri ezi ya,
Chineke onye dị nsọ na-egosikwa onwe ya na ọ dị nsọ site nʼezi omume ya.
17 Mgbe ahụ, ụmụ atụrụ ga-akpa nri ha dị ka ọ bụ nʼọzara ka ha nọ,
ehi na anụ ụlọ ga-akpa nri ha nʼụlọ ndị ọgaranya niile e tikpọrọ etikpọ.
18 Ahụhụ ga-adịrị ndị ji aghụghọ na-adọkpụgharị mmehie ha;
ahụhụ dịkwara ndị na-adọkpụgharị ajọ omume ha dịka ụdọ eji adọkpụgharị ụgbọala.
19 Nye ndị ahụ na-asị “Ka Chineke mee ngwa;
ya rụọ ọrụ ya ọsịịsọ,
ka anyị hụ ya.
Atụmatụ nke Onye nsọ nke Izrel,
ka ọ bịaruo nso, ka ọ pụta ìhè,
ka anyị nwe ike mara ihe o zubere.[a]”
20 Ahụhụ dịrị ndị na-akpọ ihe ọjọọ ezi ihe
ndị na-akpọkwa ezi ihe ihe ọjọọ,
ndị na-etinye ọchịchịrị nʼọnọdụ ìhè
na ìhè nʼọnọdụ ọchịchịrị
ndị na-etinye ihe dị ilu nʼọnọdụ ihe ụtọ,
na ihe ụtọ nʼọnọdụ ihe ilu.
21 Ahụhụ ga-adịrị ndị maara ihe nʼanya nke onwe ha,
ndị na-elekwa onwe ha anya na ha bụ ndị nwere nghọta.
22 Ahụhụ ga-adịrị ndị bụ dike nʼịṅụ mmanya,
na ndị bụkwa dimkpa nʼịgwakọta mmanya,
23 ndị na-asị onye ikpe maara nʼikpe amaghị ya nʼihi ịnata ngarị,[b]
ma wezuga ikpe ziri ezi site nʼebe onye aka ya dị ọcha nọ.[c]
24 Nʼihi ya, dịka ire ọkụ si erechapụ ahịhịa ọka,
na dịka ahịhịa kpọrọ nkụ si ada nʼime ọkụ na-enwu enwu,
otu a ka mgbọrọgwụ ha ga-ere ure
okoko ha ka ikuku ga-ebufu dịka uzuzu;
nʼihi na ha ajụla iwu niile Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile nyere,
lelịakwa okwu nke Onye nsọ Izrel.
25 Nʼihi nke a, iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide ndị ya;
o setịpụrụ aka ya na-etitu ha nʼala.
Ugwu niile ga-ama jijiji,
ozu ndị ahụ dịka ihe na-abaghị uru nʼokporoụzọ niile.
Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,
aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
26 Ọ ga-eweli ọkọlọtọ nye mba niile dị nʼebe dị anya,
ọ na-akpọkọta ndị niile nọ na nsọtụ ụwa.
Ma lee, ka ha na-abịa,
ha na-eme ngwa bịa ọsịịsọ.[d]
27 Ọ dịghị onye na-ada mba, ọ dịkwaghị onye nʼasụ ngọngọ nʼime ha,
ọ dịghị onye nʼatụ oru ụra maọbụ rahụ ụra,
ọ dịghị ihe ike nʼukwu ha nke tọpụrụ atọpụ
ọ dịghị ihe ikechi akpụkpọụkwụ nke dọbiri adọbi.[e]
28 Àkụ ha niile dị nkọ,
ekweela ụta ha niile,
ụkwụ ịnyịnya dị ka nkume ọkụ,
ụkwụ ụgbọ agha ha dị ka oke ifufe.
29 Ha na-ebigbọ dịka ọdụm,
ha na-ebigbọkwa dịka ụmụ ọdụm;
ha na-asụ mgbe ha wụkwasịrị nʼelu ihe ndọgbu.
Ha na-ejide ndị m, kpụrụ ha laa, ọ dịkwaghị onye nnapụta ha nwere.
30 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-ebigbọ nʼelu ya
dịka mbigbọ nke oke osimiri.
A sịkwa na mmadụ elegide ala ahụ anya,
ọ ga-ahụ na ọchịchịrị na ihe mgbu,