2
Ugwu nsọ Onyenwe anyị
1 Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem.
2 Nʼụbọchị ikpeazụ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị , ga-abụ nke eguzobere
dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile,
a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile,
mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
3 Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa,
“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị ,
ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ[a] ya niile,
ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”[b]
Iwu ga-esi na Zayọn pụta,
okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.[c]
4 Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile,
doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche.
Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge;
kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi.
Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,
maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
5 Unu ụlọ Jekọb, bịanụ
ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
Ụbọchị Onyenwe anyị
6 Gị, bụ Onyenwe anyị , Ị gbakụtala ndị gị,
bụ ụlọ Jekọb azụ.
Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ.
Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia.
Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.
7 Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo,
ha bara ụba nke ukwuu.
Ala ha jupụtara nʼịnyịnya.
Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu.
8 Ala ha jupụtara nʼarụsị,
ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ,
ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ.
9 Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala,
meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala.
Ya mere, agbagharala ha.
10 Gaanụ nʼime nkume,
zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị ,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya.
11 Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala,
mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala.
Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
12 Onyenwe anyị , Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro
nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu,
nʼihi na ihe niile e buliri elu
(ka a ga-eweda nʼala),
13 nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn,[d]
na osisi ook niile nke Bashan,
14 nye ugwu ukwu niile nke dị elu,
na ugwu nta niile e buliri elu,
15 nye ụlọ elu niile,
na mgbidi niile e wusiri ike,
16 nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa,[e]
na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.
17 Onye nganga ka a ga-eweda nʼala,
mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala.
Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
18 A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
19 Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume,
na nʼọnụ e gwuru nʼala,
nʼihi egwu Onyenwe anyị ,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,
mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
20 Nʼụbọchị ndị ahụ,
ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ,
nke ha kpụrụ ma na-efe,
hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
21 Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume,
na nʼime ọgba niile nke oke nkume
nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị ,
na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,
mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.
22 Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi.
O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime,