1 Ebram na nwunye, na ihe niile ha nwere hapụrụ ala Ijipt, gaa ije bịaruo Negev. Lọt sokwa ha. 2 Nʼoge a, Ebram aghọọla ọgaranya dị ukwuu, onye nwere akụnụba nke ọtụtụ anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo.
3 Ha sitere na Negev pụọ ije site nʼotu ebe ruo nʼebe ọzọ tutu ha erute Betel, nʼebe dị nʼetiti Betel na Ai, ebe ọ mara ụlọ ikwu ya na mbụ. 4 Nʼebe nsọ o wukwara ebe ịchụ aja na mbụ, nʼebe ahụ Ebram kpọkuru aha
5 Ugbu a Lọt, onye ya na Ebram so na njem ya, bụkwa onye nwere akụnụba nke igwe ewu na atụrụ, na igwe ehi, na ọtụtụ ụlọ ikwu. 6 Ma ala ebe ha nọ ezurughị ha mgbe ha nọkọrọ ọnụ nʼihi na ihe onwunwe ha dị ukwuu ruo na ha enweghị ike ịnọkọ ọnụ. 7 Nke a mere esemokwu ji dapụta nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ Ebram na ndị ọzụzụ anụ ụlọ Lọt. Ndị Kenan na ndị Periz bikwa nʼala ahụ nʼoge ahụ.
8 Ya mere Ebram gwara Lọt sị, “Biko, ka esemokwu ghara ịdị nʼetiti mụ na gị, maọbụ nʼetiti ndị ọzụzụ anụ ụlọ m na ndị ọzụzụ anụ ụlọ gị, nʼihi na anyị bụ ụmụnne. 9 Lee, ọ bụ na ala a niile adịghị nʼihu gị? Ka anyị kewaa. Ọ bụrụ na ị gaa nʼakụkụ aka ekpe, aga m aga nʼakụkụ aka nri. Ma ọ bụrụ na i gaa nʼakụkụ aka nri gị, aga m aga nʼakụkụ aka ekpe.”
10 Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige
14 Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ,
18 Ya mere, Ebram bugharịrị ụlọ ikwu ya, gaa biri nʼakụkụ osisi ukwu Mamre nke dị na Hebrọn. O wuru ebe ịchụ aja nye