Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
7 Ha ga-atọgbọrọ nʼefu,
nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu.
Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe,
nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.
8 Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt,
mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.
9 “ ‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.
10 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn
bibie igwe ndị agha Ijipt niile.
11 Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere,
ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ.
Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt,
werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ.
12 Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ.
Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ.
Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
13 “ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,
“ ‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi,
mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị.
ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’ ”
Aka Fero agbajiela
20 O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21 “Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha. 22 Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ. 23 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile, 24 meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ. 25 Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt. 26 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”