1 Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa. 2 Mgbe ị gabigara osimiri Jọdan ruo nʼala ahụ
9 Mgbe ahụ, Mosis na ndị nchụaja, bụ ndị Livayị, gwakwara ndị Izrel niile okwu sị, “Nọọnụ jii, gị Izrel, gekwaa ntị! Taa, ị ghọọla ndị nke
11 Nʼotu ụbọchị ahụ ka Mosis nyere ha iwu sị,
12 Mgbe unu gafere Jọdan, ebo ndị a: Simiọn, na Livayị na Juda na Isaka na Josef na Benjamin, ga-eguzo nʼelu ugwu Gerizim gọzie ụmụ Izrel 13 Agbụrụ Ruben, Gad, Asha, Zebụlọn, Dan na Naftalị ga-eguzo nʼelu ugwu Ebal kwupụta ọbụbụ ọnụ.
14 Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile,
15 “Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya
16 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.”
17 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.”
18 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.”
19 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi nye ndị ọbịa, na ụmụ mgbei, na ndị inyom di ha nwụrụ.”
20 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-abakwuru nwunye nna ya soro ya dinaa, nʼihi na o merụọla ihe ndina nna ya.”
21 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke ya na anụmanụ ọbụla na-edina.”
22 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nwanne ya nwanyị na-akwa iko, bụ nwanne ya nke nne ya mụrụ, maọbụ nke nwunye nna ya mụrụ.”
23 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke ya na nne nwunye ya na-edina.”
24 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-etigbu mmadụ ibe ya na nzuzo.”
25 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-anara ngarị maka itigbu onye na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla.”
26 “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-adịghị eme ka iwu ndị a guzosie ike site na-edebeghị ha.”