1 Nwoke ọbụla echipịara mkpụrụ amụ ya, maọbụ nke e bipụrụ mkpụrụ amụ ya, agaghị esonye na mkpọkọta
2 Nwa ọbụla a mụtara site nʼịkwa iko agakwaghị esonye na mkpọkọta
3 Onye Amọn, maọbụ onye Moab, agaghị esonye na mkpọkọta
7 Ma eledala ndị Edọm anya, nʼihi na ndị Edọm bụ ụmụnna unu. Unu eledala ndị Ijipt anya, nʼihi na unu biri dịka ndị ọbịa nʼime ala ha. 8 Ụmụ a ga-amụrụ ha nʼọgbọ nke atọ ha nwere ike ịbata na mkpọkọta nke
9 Mgbe unu mara ụlọ ikwu unu maka ibu agha megide ndị iro unu, wezuganụ onwe unu site nʼihe ọbụla na-adịghị ọcha. 10 Nwoke ọbụla nʼetiti gị nke na-adịghị ọcha site nʼịnyụ mkpụrụ nwa nʼahụ ya nʼabalị, ga-apụ gaa nọdụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. 11 Ọ ga-anọ nʼebe ahụ ruo uhuruchi, emesịa, ọ ga-asa ahụ ya lọghachi nʼụlọ ikwu nʼanyasị.
12 Ị ga-enwekwa otu ebe ndị gị ga-anọ jee nʼogwe ga-adị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. 13 Onye ọbụla nʼime unu ga-enwe shọvel dịka otu nʼime ngwa agha ya. Mgbe ọbụla kwa o jere nʼogwe, ọ ga-eji ya gwuo ala kpochie nsị ọ nyụrụ. 14 Ụlọ ikwu gị ga-adị nsọ, nʼihi na
15 Ọ bụrụ na ohu esite nʼaka onye nwe ya gbakwute unu, akwagidela ya ka ọ lọghachi, 16 hapụ ya ka o biri nʼetiti gị nʼime obodo ọbụla masịrị ya, emegbukwala ya.
17 Ọ dịghị nwoke maọbụ nwanyị, onye Izrel ga-aghọ akwụna ụlọ arụsị. 18 Ị gaghị ewebata nʼụlọ
19 A nakwala onye Izrel ibe gị ọmụrụnwa, nʼihe ọbụla i binyere ya, maọbụ ego, maọbụ nri, ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla ọzọ nwere ike ịmụta ọmụrụnwa. 20 Onye mba ọzọ ka ị ga-ana ọmụrụnwa nʼihe i binyere ya, ọ bụghị onye Izrel ibe gị. Ka
21 Mgbe i kwere
24 Ọ bụrụ na ị banye nʼubi vaịnị onye agbataobi gị, i nwere ike ghọrọ mkpụrụ vaịnị ọbụla ị chọrọ rachaa nʼebe ahụ, ma etinyela mkpụrụ ọbụla nʼakpa gị. 25 Otu a kwa, ị banye nʼubi ọka onye agbataobi gị, ghọrọ mkpụrụ ọka ọbụla ị chọrọ nʼaka gị, nọọkwa nʼebe ahụ taa ya, ma ị gaghị etinye mma iwe ihe ubi nʼime ọka ha ndị guzoro eguzo.
<- Diuteronomi 22Diuteronomi 24 ->-
a 23:18 Maọbụ, ego e retara na nkịta