6
Ahụhụ dịrị ndị na-ebi ndụ dị jụụ
1 Ahụhụ dịrị ndị ahụ na-enweghị nsogbu nʼime Zayọn,
na ndị ahụ na-ebi nʼizuoke nʼugwu Sameria,
bụ ndị a maara aha ha na isi mba nke mba niile,
ndị agbụrụ Izrel niile na-abịakwute.
2 Gaanụ Kalne, ka unu lee ya anya,
site nʼebe ahụ unu jeruo Hamat, obodo ukwu ahụ,
mgbe ahụ unu gbada jeruokwa Gat nke dị na Filistia
Ha ọ kacha alaeze abụọ unu mma?
Ka ala ha ọ karịrị ndị nke unu?
3 Unu na-ewezuga ụbọchị ọjọọ ahụ
ma na-eme ka ụbọchị ihe ike bịa ngwangwa.
4 Azịgba unu ndị na-edina nʼelu akwa ọdụ enyi,
na-agbatị onwe ha nʼelu ihe ndina ha,
na-erikwa anụ ụmụ atụrụ dị mma
na ụmụ ehi e mere ka ha gbaa abụba.
5 Ndị na-abụ abụ nke na-abaghị nʼụda ụbọ akwara,
ma were aka ha rụọra onwe ha ngwa egwu dịka Devid mere.
6 Unu na-aṅụ mmanya site nʼọba;
na-ete mmanụ makarịsịrị mma,
ma ịla nʼiyi nke Josef adịghị ewute ha.
7 Nʼihi ya, unu ga-abụ ndị a ga-ebu ụzọ mee ka ha jee biri nʼala ndị ọzọ.
Na mberede, oke oriri unu na idina ala setịa onwe unu ga-akwụsị.
Mpako bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị
8 Onye kachasị ihe niile elu, bụ
“Ihe arụ ka mfụli elu nke Jekọb bụrụ m;
ana m akpọkwa ebe ya niile e wusiri ike asị.
Nʼihi ya, aghaghị m iwere obodo a
na ihe niile dị ya nʼime nyefee nʼaka ndị ọzọ.”
9 Ma ọ bụrụ na mmadụ iri afọdụ nʼime otu ụlọ, ha niile aghaghị ịnwụ. 10 Ma ọ bụrụ na nwanna, bụ onye nke na-aga ịkpọ anụ ahụ ndị a ọkụ, abata ibupụ ha nʼezi, ọ jụọ otu onye nọ nʼime ime ụlọ ahụ sị, “O nwere onye ọzọ gị na ya nọ?” Onye ahụ zaa, “Ọ dịghị,” mgbe ahụ nwanna ahụ ga-asị, “Nọọ jụụ. Anyị agaghị akpọ aha
11 Nʼihi na lee, Onyenwe anyị e nyela iwu.
Ọ ghaghị itikpọsị ụlọ ukwu ndị ahụ,
tiriekwa ụlọ nta ndị ahụ niile.
12 Ịnyịnya ọ na-agba ọsọ nʼelu nkume?
Mmadụ ọ na-eji ehi abụọ e jikọtara ọnụ akọ elu osimiri?
Ma unu atụgharịala ikpe ziri ezi mee ya ka ọ ghọọ nsi,
mkpụrụ nke ezi omume ka unu mekwara ka ọ ghọọ ihe ilu.
13 Unu ndị na-aṅụrị ọṅụ nʼihi na unu meriri obodo Lo Deba,[a]
ndị na-asị, “Ọ bụghị site nʼike aka anyị ka anyị nwetakwara Kanaịm?”[b]
14 “Ma lee, aghaghị m ime ka otu mba bilie imegide unu, ụlọ Izrel,”
otu a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.
“Ha ga-emekpa unu ahụ site nʼụzọ niile