1 Ọzọkwa,
2 Ya mere, eze gwara Joab na ndịisi ọchịagha ya ha so, “Jegharịa nʼebo niile nke Izrel, site na Dan ruo Bịasheba, gụkọtaa ndị tozuru ije agha nʼIzrel niile ka m nwee ike mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”
3 Joab zaghachiri eze, “Ka
4 Ma okwu eze dị ike karịa nke Joab na nke ndị ọchịagha ahụ. Ya mere, ha hapụrụ ihu eze pụọ ịgụ ndị agha Izrel ọnụ.
5 Mgbe ha gabigachara Jọdan, ha manyere ụlọ ikwu ha na nso Aroea, nʼaka nri obodo ahụ dị nʼetiti ndagwurugwu Gad na-eru Jeza, 6 ha gara Gilead ruokwa nʼala Taatim Hodshi, bịarukwaa Dan Jaan, jee gburugburu jeruo Saịdọn. 7 Ha jere ruokwa nʼebe e wusiri ike nke Taịa, na obodo niile nke ndị Hiv,[a] na nke ndị Kenan. Nʼikpeazụ, ha gaara ruo Bịasheba nʼime ndịda Juda.
8 Mgbe ha jegharịchara nʼala ahụ niile; ha lọghachitere na Jerusalem na ngwụcha ọnwa nke itoolu na iri abalị abụọ ya.
9 Joab nyere eze ngụkọta ọnụọgụgụ nke ndị agha Izrel. NʼIzrel, ha dị narị puku asatọ, bụ ndị ikom ndị tozuru iji mma agha buo agha, na Juda ha dị narị puku ise.
10 Ma obi Devid bidoro ịta ya ụta mgbe ọ gụchara ndị ikom na-alụ agha ọnụ. Ọ sịrị
11 Nʼụtụtụ echi ya, tupu Devid na-eteta nʼụra, okwu
13 Ya mere, Gad jekwuuru Devid sị ya, “Ọ bụ ka oke ụnwụ ịda nʼala gị afọ atọ? Ka ọ bụ na ị ga-agbalaga site nʼihu ndị iro gị ọnwa atọ, ka ha na-achụ gị ọsọ? Ka ọ bụ ka ajọ ọrịa na-efe efe daa nʼala gị mkpụrụ ụbọchị atọ? Ugbu a, chee echiche, kpebie ọsịsa ị chọrọ ka m weghachiri onye ahụ zitere m.”
14 Devid sịrị Gad, “Anọ m nʼoke nsogbu, ọ ka mma ka anyị daba nʼaka
15 Nʼihi ya,
17 Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ na-etida ndị mmadụ, ọ sịrị
18 Nʼụbọchị ahụ, Gad bịara nʼụlọ Devid gwa ya sị, “Gaa, wuore
21 Arauna sịrị, “Gịnị mere onyenwe m, bụ eze ji bịakwute ohu ya?”
22 Arauna sịrị Devid, “Ka onyenwe m, bụ eze were ihe ọbụla ọ chọrọ, werekwa chụọ aja. Lee ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, leekwa ihe igwe ịzọcha ọka niile, na osisi ndị ahụ niile a na-anyanye ehi nʼolu,[b] ka ha bụrụ nkụ. 23 Eze, ihe ndị a niile ka mụ bụ Arauna na-enye eze, ka
24 Ma eze zaghachiri Arauna, “Ee, aghaghị m ịkwụzu gị ụgwụ ya, nʼihi na agaghị m achụrụ
-
a 24:7 Ndị Hiv, na ndị Kenan bụ ndị bi nʼala ahụ tupu ndị Izrel e merie ha nʼagha, chụpụ ha ma bichie ya.
b 24:22 Lit. yoku