2 Samuel
1 Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid si ebe ọ gara tigbuo ndị Amalek lọghachi. Devid nọrọ ụbọchị abụọ na Ziklag. 2 O ruo, nʼụbọchị nke atọ, otu nwoke si nʼọmụma ụlọ ikwu Sọl bịakwutere ya. Uwe nwoke a yi nʼahụ dọwara adọwa. Isi ya dịkwa aja aja. Ọ batara daa nʼala nʼihu Devid nʼọnọdụ inye ya nsọpụrụ.
3 Devid jụrụ ya sị, “Ebee ka i si bịa?”
4 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere? Biko gwa m.”
5 Devid jụrụ ya sị, “Olee otu i si mata na Sọl na Jonatan anwụọla?”
6 Nwokorobịa ahụ sịrị ya, “Ọ dapụtara na m nọ nʼugwu Gilboa hụ Sọl mgbe ọ dabeere nʼùbe ya. Mgbe ahụ ụgbọ agha ndị iro na ndị na-agba ịnyịnya agha na-esosi ya ike. 7 Mgbe ọ hụrụ m, ọ kpọrọ m ka m bịakwute ya. Azara m ya sị, ‘Gịnị ka m nwere ike ime?’
8 “Ọ jụrụ m sị, ‘Ị bụ onye?’
9 “Ọ sị m, ‘Biko, bịa guzo nʼakụkụ m ka ị gbuo m, nʼihi na ọ bụ ezie na m dị ndụ, ma anọ m nnọọ nʼoke ihe mgbu nke ọnwụ.’
10 “Ya mere, eguzoro m nʼakụkụ ya, gbuo ya, nʼihi na amaara m na ọ gaghị adị ndụ tee anya. Ọ bụkwa mgbe m gbusịrị ya ka m kpupụrụ ya okpueze dị ya nʼisi, gbapụtakwa ya mgbaaka dị nʼogwe aka ya, chịrị ha, ka m chịtara gị ha, onyenwe m.”
11 Mgbe Devid na ndị ikom ya nụrụ ihe ndị a. Ha dọwara uwe ha. 12 Ha ruru ụjụ. Kwaa akwa. Bukwaa ọnụ ruo oge anyasị nʼihi Sọl na Jonatan nwa ya nwoke, na nʼihi ndị agha
13 Mgbe ahụ, Devid jụrụ nwokorobịa ahụ wetara ozi ahụ ajụjụ sị, “Olee ebe i si bịa?”
14 Devid jụrụ ya sị, “Gịnị mere i ji setịpụ aka gị, na-atụghị ụjọ, tigbuo onye
15 Devid kpọrọ otu nʼime ndị ikom ya sị ya, “Gbuo ya!” Nwoke ahụ weere mma agha gbuo ya. 16 Mgbe ahụ Devid sịrị ya, “Ọbara gị laa gị nʼisi, nʼihi na ị ji ọnụ gị kwupụta sị, ‘Egburu m onye
17 Emesịa, Devid depụtara abụ akwa a nʼihi Sọl na Jonatan. 18 O nyere iwu ka akụziere ndị Juda, abụ ùta a. E dere ya nʼime akwụkwọ Jesha.
-
a 1:20 Obodo Gat na Ashkelọn dị nʼala Filistia. 1Sa 6:17; 1Sa 27:2
b 1:20 Otu obodo nʼime ala ndị Filistia Jer 25:20
c 1:21 Ka ubi unu dị nʼelu ugwu ghara ịmịpụta mkpụrụ
d 1:21 Ọ bụ akpụkpọ anụ a mịkpọrọ amịkpọ, nke e tere mmanụ ka e ji eme ọta. Ọ bụ mmanụ ahụ e teere ya, na-eme ka ọ ghara ịma ebu, meekwa ka ọ na-amị amị, i ji gbochie ka àkụ a gbara ghara imife nʼọta ahụ. Ma ọta ndị a, nʼihi na ha amịjuola ọbara nʼebe ọ dị ukwuu, ha adịghị abakwa uru ọta na-aba nʼoge agha.
e 1:24 Maọbụ, Ụmụ ndị inyom Izrel.
f 1:26 1Sa 18:1-4; 19:2; 20:17