1 Emesịa, Ịlaisha onye amụma, kpọrọ otu onye nʼime ụmụ ndị amụma sị ya, “Jikere, fanye ọnụ uwe mwụda gị nʼeriri ikere nʼukwu gị,[a] werekwa karama mmanụ oliv a nʼaka gị, bịa ka ị gaa Ramọt Gilead. 2 I jeruo ebe ahụ, jee hụ Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi anya. Mee ka o bilie site nʼetiti ndị ha na ya nọ. Mekwaa ka gị na ya naanị baa nʼime ụlọ. 3 Were karama mmanụ wụkwasị ya nʼisi gwa ya okwu sị, ‘Otu a ka
4 Nwokorobịa onye amụma ahụ gara Ramọt Gilead. 5 Mgbe o jeruru, ọ hụrụ ebe ọchịagha ahụ nọdụrụ nʼala nʼetiti ndịisi agha ibe ya. O kwuru sị, “Enwere m ozi m ga-ezi gị, ọchịagha.”
6 Jehu biliri baa nʼime ụlọ. Nwokorobịa onye amụma ahụ wụkwasịrị ya mmanụ nʼisi, sị ya, “Otu a ka
11 Jehu jekwuuru ndịisi agha ibe ya. Otu onye nʼime ha jụrụ ya sị, “Gịnị ka onye ara ahụ chọrọ bịa? Udo ọ dịkwa?”
12 Ha sịrị, “Ihe i kwuru abụghị eziokwu, gwa anyị ihe o kwuru.”
13 Ngwangwa ha chịịrị uwe mgbokwasị ha niile doo ha nʼusoro nʼala ebe ahụ ka Jehu zọkwasị ha ụkwụ. Ha fụrụ opi ike tie mkpu sị, “Jehu bụ eze!”
14 Otu a ka Jehu nwa Jehoshafat, nwa Nimshi, si gbaa izu megide Joram. (Nʼoge a, Joram na ndị Izrel niile na-eche Ramọt Gilead nche, nʼihi Hazael eze Aram.) 15 Ma Joram bụ eze, laghachitere na Jezril ebe ọ nọ ka ahụ dị ya mma maka ahụ ndị Aram merụrụ ya mgbe ya na Hazael, eze Aram lụrụ agha. Ya mere, Jehu sịrị, “Ọ bụrụ na nke a bụ uche unu, ime m eze unu, unu ekwela ka onye ọbụla si nʼobodo a gbapụ, gaa Jezril kọọ akụkọ a.” 16 Mgbe ahụ, Jehu wụkwasịrị nʼelu ụgbọ agha ya gbaga Jezril, nʼihi na Joram nọ nʼebe ahụ na-ezu ike. Ma Ahazaya, bụ eze Juda gakwara ileta ya.
17 Mgbe onye nche nọ nʼụlọ elu Jezril hụrụ Jehu na ndị agha ya ka ha na-abịa, o tiri mkpu sị, “Lee, o nwere ndị agha na-abịa.”
18 Onye ọgbaịnyịnya ahụ nọkwasịrị nʼelu ya gbapụ izute Jehu, sị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ”
19 Eze zipụrụ onye ọgbaịnyịnya nke abụọ. Mgbe ọ bịakwutere ha ọ sịrị, “Otu a ka eze sịrị, ‘Udo ọ dịkwa?’ ”
20 Onye ahụ nọ na-eche nche sịrị, “Ọ garuola ha nso, ma ọ dịghị alọghachitekwa azụ. Ma ọgbụgba ịnyịnya dịka ọ bụ Jehu nwa Nimshi, nʼihi na ọ na-agba ịnyịnya ya dịka onye na-ayị ara.”
21 Joram nyere iwu sị, “Kwadooro m ụgbọ agha m.” Mgbe a kwadooro ya, Joram eze Izrel, na Ahazaya, eze Juda, pụtara nọkwasị nʼụgbọ agha, onye ọbụla na nke ya, pụọ ịga izute Jehu. Ha zutere ya nʼoke ala ubi Nebọt, onye Jezril. 22 Mgbe Joram hụrụ Jehu, ọ jụrụ, “Ị bịara nʼudo? Udo ọ dịkwa, Jehu?”
23 Joram chigharịrị ụgbọ agha ya bido ịgba ọsọ. Mgbe ọ na-agba ọsọ, o tiri mkpu kpọkuo Ahazaya sị ya, “Ahazaya, Aghụghọ dị, ọgbaaghara dị!”
24 Jehu jiri ike ya niile dọtịa ụta o ji nʼaka ya gba ya Joram. Ọ gbatara Joram àkụ ahụ nʼazụ. Àkụ ahụ sikwa ya nʼobi pụta. Nke a mere ka Joram daa nʼime ụgbọala ya nwụọ. 25 Mgbe ahụ, Jehu sịrị Bidka, bụ onyeisi agha ya, “Bulie ya, tụba ya nʼubi Nebọt onye Jezril. Chetakwa na mụ na gị nọkwasịrị nʼelu ịnyịnya, anyị abụọ, na-eso nna ya Ehab, mgbe
27 Mgbe Ahazaya eze Juda, hụrụ ihe mere, ọ gbaara ọsọ na-agbago nʼụzọ Bet Hagan. Ma Jehu chụsoro ya, na-eti mkpu sị, “Gbukwuonụ ya.” Ha merụrụ ya ahụ ka ọ nọ nʼụgbọ agha ya, nʼụzọ ịga Gua, nso Ibleam, ọ gbara ọsọ ga Megido ebe ọ nọ nwụọ. 28 Ndị ohu ya ji ụgbọ agha bịa buru ozu ya bubata ya na Jerusalem, lie ya nʼebe e liri nna nna ya ha, nʼobodo Devid. 29 Nʼafọ iri na otu nke ọchịchị Joram nwa Ehab, ka Ahazaya malitere ịbụ eze Juda.
30 Mgbe Jezebel nụrụ na Jehu abịaruola Jezril, ọ banyere nʼụlọ ya, tee uri nʼanya abụọ, dozie agịrị isi ya, pụta bịa nọdụ ala nʼakụkụ oghereikuku, site nʼebe ahụ na-elepụ anya nʼezi. 31 Mgbe Jehu batara nʼọnụ ụzọ e si abata ụlọeze, Jezebel kpọkuru ya sị, “Ị bịara nʼudo, gị Zimri, gị onye gburu nna gị ukwu.”
32 Jehu leliri anya elu lee anya na oghereikuku tie mkpu sị, “Onye dịnyeere m?” Onozi abụọ maọbụ atọ na-eje ozi nʼụlọeze lepụtara anya lee ya anya. 33 Jehu nyere ha iwu sị ha, “Tụdanụ ya nʼala.” Ya mere, ha si nʼelu ebe ahụ tụda ya nʼala. Mgbe ọ daruru ala, ọbara ya fesasịrị nʼahụ mgbidi ụlọ na nʼahụ ịnyịnya ndị ji ụkwụ ha zọjaa ya.
34 Jehu banyere nọ nʼime ụlọeze rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ. Emesịa, o nyere iwu sị, “Leenụ nwanyị a a bụrụ ọnụ; burunu ya gaa lie ya, nʼihi na ọ bụ ada eze.”[b] 35 Mgbe ha pụtara ili ya, ọ bụ naanị okpokoro isi ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya abụọ, na aka ya abụọ ka ha hụrụ. Ha ahụkwaghị anụ ahụ ya. 36 Ha laghachiri gwa Jehu ihe ha hụrụ. Ọ zara sị ha, “Nke a bụ okwu