1 Mgbe Atalaya nne Ahazaya hụrụ na nwa ya nwoke anwụọla, ọ gara nʼihu bido igbu ndị niile a mụrụ nʼụlọ eze. 2 Ma Jehosheba,[a] bụ nwa nwanyị eze Jehoram,[b] ma bụrụkwa nwanne nwanyị Ahazaya, kuuru Joash[c] nwa Ahazaya, zopu ya site nʼetiti ụmụ ndị ikom eze, bụ ndị a chọrọ igbu egbu. O zoro ya na nwanyị na-elekọta ya anya nʼime ụlọ ndina, ka Atalaya hapụ ịhụ ya, nke a mere na-egbughị ya. 3 Ya na nwanyị na-elekọta ya anya nọgidere na nzuzo nʼime ụlọnsọ
4 Nʼafọ nke asaa, Jehoiada, ziri ozi kpọọ ndị ọchịagha na-achị narị ndị agha, ndị Karị[d] na ndị nche oku, mee ka ha bịakwute ya nʼụlọnsọ ukwu
9 Ndị ọchịagha ndị a na-achị narị ndị agha mere dịka Jehoiada, onye nchụaja nyere nʼiwu. Onye ọbụla kpọrọ ndị ikom ya, ma ndị na-emechi ọrụ, ma ndị na-abata ịrụ ọrụ nʼụbọchị izuike, bịakwute Jehoiada, bụ onye nchụaja. 10 O nyere ndị ọchịagha ahụ ùbe na ọta niile, ndị bụrịị nke eze Devid, ndị dị nʼụlọnsọ ukwu
12 Jehoiada kpọpụtara nwa eze, kpube ya okpueze nʼisi, o nyere ya otu akwụkwọ nke ihe ọgbụgba ndụ ahụ, chie ya eze. Ha tekwara ya mmanụ ịbụ eze. Ndị niile nọ nʼebe ahụ kụrụ aka, tie mkpu, sị, “Ka eze dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi!”
13 Mgbe Atalaya nụrụ mkpọtụ nke ndị nche na ndị mmadụ na-eme, ọ gakwuru ndị ahụ nọ nʼụlọnsọ ukwu
15 Jehoiada, bụ onye nchụaja nyere ndịisi ọchịagha na-achị narị ndị agha, bụ ndị na-elekọta usuu ndị agha, iwu sị ha, “Sitenụ nʼebe ahụ kpọpụta ya nʼetiti ahịrị unu, onye ọbụla nke gbasoro ya, werenụ mma agha gbuo onye ahụ.” Nʼihi na onye nchụaja sịrị, “Agaghị egbu ya nʼime ụlọnsọ
17 Jehoiada mere ka ọgbụgba ndụ dị nʼetiti
21 Joash[g] gbara afọ asaa mgbe ọ malitere ịbụ eze.
<- 2 Ndị Eze 102 Ndị Eze 12 ->-
a 11:2 Eleghị anya, nne Jehosheba dị iche na nne Atalaya, ma nʼihi na Jehosheba bụ nwunye Jehoiada onye nchụaja, o zoro Joash nʼotu ọnụụlọ nʼime ụlọnsọ ukwu 2Ih 22:11
b 11:2 Mgbe ụfọdụ a na-akpọkwa ya Jehoram
c 11:2 Joash bụ nwa eku nʼaka nke ka na-anụ ara, o rubeghị otu afọ mgbe ihe ndị a mere.
d 11:4 Ndị Karị bụ ndị agha e goro ego si Eshịa na mpaghara Tọki. Ha bụ ndị nọchiri anya ndị agha Keret, ndị jere ozi nʼoge eze Devid. 2Sa 8:18
e 11:4 Nʼakwụkwọ 2Ih 23:2 nʼebe ahụ e mere ka anyị mara na akpọrọ ndị Livayị, na ndịisi Juda niile nʼoku nzuzo a.
f 11:14 2Ez 23:3; 2Ih 34:31
g 11:21 Maọbụ, Jehoash
Languages