1 Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na unu ga-anagide m ka m kwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nagidenụ m. 2 Ekworo m nwere nʼebe unu nọ bụ ekworo nke Chineke. Ekwere m nkwa iwere unu nye otu di, ya bụ Kraịst, ka m nwe ike chee unu nʼihu ya dịka nwaagbọghọ dị ọcha nke na-amaghị nwoke. 3 Ma ana m atụ egwu, na dịka agwọ jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv, ndị nrafu ga-eji aghụghọ duhie unu, mee ka unu kwụsị iji obi dị ọcha na uche ziri ezi jeere Kraịst ozi. 4 Nʼihi na unu gaara anara onye ọzọ bịakwutere unu na-ekwusa Jisọs ọzọ nke na-abụghị nke anyị kwusara, unu gaara anarakwa ike nke mmụọ ọzọ dị iche na-abụghị ike nke Mmụọ Nsọ ahụ unu natara, unu gaara ekwenyekwa na nkuzi ọzọ dị iche, na-abụghị oziọma ahụ nke unu natara.
5 Ma echeghị m na ọ dị ụzọ ọbụla ndị ozi a maara aha ha si kara m mma. 6 Ọ bụrụ na m abụghị onye ọka okwu, abụ m onye ọka mmụta. Anyị akọwarala unu nke a ọtụtụ mgbe nʼụzọ dị iche iche nʼihe niile. 7 Ọ ga-abụ na-emere m ihe ọjọọ mgbe m wedara onwe m ala ka e welie unu elu, nʼihi nʼanaghị m unu ihe ọbụla mgbe m na-ekwusara unu oziọma Chineke? 8 Ọ bụ nzukọ nọ nʼebe ọzọ nyeere m aka mgbe m na-arụ ọrụ nʼetiti unu. Ọ bụ site nʼaka ha ka m ji nata nkwado, dịka ụgwọ ọrụ m, ka m nwee ike inyere unu aka. 9 Ma mgbe m nọ nʼetiti unu abụghị m ibu arọ nye onye ọbụla nʼoge mkpa m. Nʼihi na ụmụnna si Masidonia wetaara m ihe niile na-akpa m mkpa. Ebe ọ bụ na m gbalịrị debe onwe m, ka m ghara ịbụ ibu arọ nye unu nʼụzọ ọbụla nʼoge gara aga, agaghị m abụkwa ibu arọ nye unu nʼoge dị nʼihu. 10 Ebe eziokwu nke Kraịst dị nʼime m, ịnya isi m nke a agaghị akwụsị na mpaghara Akaịa[a] niile. 11 Nʼihi gịnị? Ọ bụ nʼihi na m ahụghị unu nʼanya? Chineke maara na m hụrụ unu nʼanya.
12 Ma aga m aga nʼihu na-arụ ọrụ m na-achọghị ka unu nyere m aka nʼụzọ ọbụla ka m si otu a mee ka ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị ozi ghara ịnya isi kwuokwa na ha na-arụ ọrụ dịka anyị si arụ ọrụ anyị nʼetiti unu. 13 Nʼihi na ndị dị otu a bụ ndị ozi ụgha, ndị ọrụ aghụghọ, ndị na-eme onwe ha ka ha bụ ndị ozi Kraịst. 14 Ma omume ha adịghị eju m anya, nʼihi na ekwensu gbanwere onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè. 15 Ya mere, ọ bụghị ihe iju anya ma ọ bụrụ na ndị na-ejere ya ozi emee onwe ha dịka ndị na-eje ozi ụzọ ezi omume. Ma nʼọgwụgwụ oge, ha ga-anata ụgwọ dịka ọrụ ha si dị.
16 Dịka m kwuru na mbụ, ka onye ọbụla ghara iche na m bụ onye na-enweghị uche. Ọ bụrụkwarị na unu na-eche ụdị echiche a, biko naranụ m dịka onye na-enweghị uche, ka m nwee ike ịnya isi nke nta dịka ndị ọzọ si eme. 17 Ma nʼihe m dabeere na-anya isi, adịghị m ekwu okwu dịka Onyenwe anyị ga-ekwu, maọbụ dịka onye na-enweghị uche. 18 Ebe ọtụtụ mmadụ na-anya isi banyere ihe ha bụ nʼụzọ ụwa si eme. Mụ onwe m ga-anyakwa isi. 19 Unu were obi ụtọ na-anagide ndị na-enweghị uche, ebe unu onwe unu nwere uche. 20 Unu na-anagide ya ma ọ bụrụ na onye ọbụla eme unu ndị ohu ha, maọbụ jiri anya ike nakọrọ unu ihe unu nwere, maọbụ ghọgbuo unu, maọbụ bulie onwe ya elu dịka ha karịrị unu, maọbụ maa unu uraa nʼihu. 21 Nʼezie, ọ bụ ihere m, ịnabata na anyị bụ ndị na-adịghị ike nʼezie nye nke a.
30 Kama ọ bụrụ na o kwesiri ka m nyaa isi aga m anya isi banyere ihe ndị ahụ na-egosi adịghị ike m. 31 Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu. 32 Nʼobodo Damaskọs, onye ọchịchị ala ahụ nke eze obodo ahụ a na-akpọ Aretas họpụtara, ndị na-eche obodo Damaskọs nche ka ha jide m. 33 Ma e tinyere m nʼime nkata, site nʼoghere dị na mgbidi gbara obodo ahụ gburugburu wedata m, m gbanarị ya.
<- 2 Ndị Kọrint 102 Ndị Kọrint 12 ->-
a 11:10 Akaịa bụkwa Griis.