1 Josaya gbara afọ asatọ mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị iri afọ atọ na otu na Jerusalem. 2 O mere ihe ziri ezi nʼanya
3 Nʼafọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ okorobịa, o bidoro iji obi ya niile na-achọ Chineke nke nna ya Devid. Nʼafọ iri na abụọ nke ọchịchị ya, ọ malitere ime ka Juda na Jerusalem dị ọcha site nʼiwezuga ebe ịchụ aja niile dị elu, na ogidi Ashera niile, na arụsị a pịrị apị na nke a kpụrụ akpụ niile. 4 Nʼihu ya o mere ka a kwatuo ebe ịchụ aja Baal nʼike. Ọ kụdara ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ dị nʼelu ebe ịchụ aja Baal ndị ahụ, tijisie ogidi Ashera niile, na arụsị na oyiyi niile. Ọ kụjasịrị ha niile, kpokọrọ ha ghasaa ha nʼelu ili ndị na-efe ha. 5 Ọ kpọrọ ọkpụkpụ ndị nchụaja ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja arụsị ha, si otu a mee ka Juda na Jerusalem dị ọcha. 6 Nʼobodo ndị Manase, na Ifrem na Simiọn, ruo na Naftalị, na mkpọmkpọ ebe ha niile gburugburu. 7 O titụrụ ebe ịchụ aja nke arụsị niile na ogidi arụsị Ashera, gwepịa arụsị ndị a niile dịka ntụ. Otu a ka o mere nʼala Izrel niile tupu ọ laghachi Jerusalem.
8 Nʼafọ nke iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, mgbe o mere ka ala ahụ na ụlọnsọ dị ọcha, o zigara Shefan nwa Azalaya, Maaseia onye na-achị obodo, na Joa nwa Joahaz, onye na-edekọ akụkọ, ka ha wuzie ụlọnsọ
9 Ha jekwuru Hilkaya onyeisi nchụaja nye ya ego nke e webatara nʼụlọnsọ Chineke, nke ndị Livayị bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ nakọtara site nʼaka ndị Manase na Ifrem, na ndị niile fọdụrụ nʼIzrel, na sitekwa nʼaka ndị Juda na Benjamin, na ndị niile bi na Jerusalem. 10 Mgbe ahụ, ha nyefere ya nʼaka ndị ikom ahọpụtara maka ilekọta ọrụ nʼụlọnsọ
12 Ndị ọrụ a rụrụ ọrụ ha nʼikwesị ntụkwasị obi. Ndị nlekọta ha bụ ndị Livayị ndị a: Jahat na Ọbadaya ndị si nʼikwu Merari, na Zekaraya na Meshulam ndịisi nʼikwu Kohat. Ndị Livayị ndị ọzọ, ndị bụ ndị nwere nghọta nʼiti ngwa egwu dị iche iche 13 ka e mere ndị nlekọta ndị na-ebu ibu. Ha lekọtakwara ndị niile rụrụ ọrụ dị iche iche. Ụfọdụ nʼime ndị Livayị ndị a bụ ndị ode akwụkwọ na ndị na-edekọ ihe, na ndị na-eche ọnụ ụzọ nche.
14 Mgbe ha na-ewepụta ego anabatara nʼụlọnsọ
16 Mgbe ahụ, Shefan buuru akwụkwọ ahụ wegara ya eze, gwa ya sị, “Ndị ozi gị na-eje ozi ha dịka ihe niile i tinyere ha nʼaka si dị. 17 Ha enyefela ego niile nke dị nʼụlọnsọ
19 Mgbe eze nụrụ ihe niile e dere nʼakwụkwọ iwu ahụ, ọ dọwara uwe ya. 20 O nyere Hilkaya, Ahikam nwa Shefan, Abdon nwa Maịka, Shefan ode akwụkwọ na Asaya, bụ onye ọrụ eze, iwu, sị ha, 21 “Gaanụ jụta
22 Ya mere, Hilkaya na ndị ahụ eze zipụrụ ya na ha, jekwuuru Hulda, onye amụma nwanyị, onye bụ nwunye Shalum, nwa Tokhat, nwa Hasra. Onye nlekọta ebe a na-edebe uwe. Hulda na-ebi na mpaghara Jerusalem e wuru ọhụrụ.
23 Ọ sịrị ha, “Otu a ka
29 Mgbe ahụ, eze kpọrọ ndị okenye Juda na Jerusalem niile. 30 Ọ gara nʼụlọnsọ ukwu
32 O mekwara ka ndị niile nọ na Jerusalem na Benjamin kwee Onyenwe anyị otu nkwa ahụ. Ndị niile bi na Jerusalem mezukwara ihe ndị a dịka ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Chineke nna nna ha si dị.
33 Josaya sitere nʼala niile bụ nke ndị Izrel wezuga ihe arụ niile bụ arụsị, o mere ndị niile nọ nʼIzrel nʼoge ahụ ka ha fee