1 Ugbu a, Jehoshafat nwere akụnụba na ugwu buru ibu, bịakwa ghọọ ọgọ Ehab. 2 Mgbe afọ ole na ole gasịrị, Jehoshafat gara Sameria ileta Ehab. Ehab gbuuru ya na ndị ya na ha yi ọtụtụ atụrụ na ehi, ọ kpọrọ oriri kwagide ya ka o buso Ramọt Gilead agha. 3 Ehab eze Izrel jụrụ Jehoshafat eze Juda, sị, “Ị ga-eso m buso Ramọt Gilead agha?”
5 Ya mere, eze Izrel kpọkọtara ndị amụma dị narị ndị ikom anọ nʼọnụọgụgụ jụọ ha, sị, “Anyị a ga-ebuso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?”
6 Ma Jehoshafat jụrụ, “Ọ bụ na e nwekwaghị onye amụma
7 Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ
8 Mgbe ahụ, eze Izrel kpọrọ otu onye na-ejere ya ozi sị ya, “Mee ọsịịsọ kpọta Maikaya nwa Imla nʼebe a.”
9 Ehab eze Izrel na Jehoshafat eze Juda, onye ọbụla yi uwe eze ya, na-anọkwasị nʼocheeze ya nʼebe ịzọcha ọka nʼọnụ ụzọ ama e si abata obodo Sameria. Ndị amụma ahụ niile nọkwa na-ebu amụma nʼihu ha. 10 Zedekaya nwa Kenaana, mere mpi igwe, ọ kwupụtara sị, “Nke a bụ ihe
11 Ndị amụma ndị ọzọ niile na-ebu otu ihe ahụ nʼamụma, na-asị, “Gaa, busoo Ramọt Gilead agha, ị ga-enwekwa mmeri, nʼihi na
12 Onyeozi ahụ nke gara ịkpọ Maikaya sịrị ya, “Lee, ndị amụma ndị ọzọ na-agụpụghị onye ọbụla na-ebu amụma ọganihu nye eze. Mee ka okwu gị na ha dakọta. Kwuokwa ihe ga-adị eze mma.”
13 Ma Maikaya sịrị, “Dịka
14 Mgbe ọ bịarutere, eze jụrụ ya, “Maikaya, ọ bụ anyị gaa buso Ramọt Gilead agha, ka ọ bụ m hapụ?”
15 Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha
16 Mgbe ahụ, Mikaya zara, “Ahụrụ m Izrel niile ka ha gbasasịrị nʼelu ọtụtụ ugwu dịka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ atụrụ ma
17 Eze Izrel sịrị Jehoshafat, “Ọ bụ na m agwaghị gị na ọ dịghị mgbe ọ na-ebu amụma ihe ọma banyere m, kama naanị ihe ọjọọ?”
18 Maikaya gara nʼihu sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu
21 “Ọ zara, ‘Aga m apụ bụrụ mmụọ nrafu nʼọnụ ndị amụma ya niile.’
22 “Ma ugbu a,
23 Mgbe ahụ, Zedekaya nwa Kenaana, gara nso maa Maikaya aka na nti, jụọ ya, “Olee ụzọ ka mmụọ ahụ sitere na
24 Maikaya zaghachiri, “Ị ga-achọpụta nke a nʼụbọchị ị ga-agbaba nʼime ime ụlọ izo onwe gị.”
25 Eze Izrel nyere iwu sị, “Jidenụ Maikaya kpụgara ya Amọn, onye na-achị obodo a, na Joash, nwa eze. 26 Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka eze sịrị: Tinye nwoke a nʼụlọ mkpọrọ, nye ya naanị achịcha na mmiri ọṅụṅụ tutu ruo mgbe m lọghachiri nʼudo.’ ”
27 Maikaya kwupụtara sị, “Ọ bụrụ na ị lọghachi nʼudo, ọ pụtara na ọ bụghị
28 Ya mere, eze Izrel na Jehoshafat eze Juda pụrụ gawa Ramọt Gilead. 29 Eze Izrel gwara Jehoshafat, sị, “Aga m ejikere onwe m dịka m bụ onye ọzọ banye nʼọgbọ agha, ma gị onwe gị yiri uwe eze gị.” Ya mere, eze Izrel nwogharịrị onwe ya ka onye ọzọ baa nʼọgbọ agha.
30 Ma eze Aram enyelarị ndị ọchịagha, ndị na-agba ụgbọ agha iwu sị, “Unu ebusola onye ọbụla agha, maọbụ onye ukwu maọbụ onye nta, karịakwa naanị eze Izrel.” 31 Mgbe ndị ọchịagha na-achị ụgbọ agha hụrụ Jehoshafat, ha chere nʼobi ha, “Onye a bụ eze Izrel.” Nʼihi ya, ha tụgharịrị ibuso ya agha, ma Jehoshafat tiri mkpu, nke mere na
33 Ma otu onye dọrọ ụta ya gbapụ ya na-ebughị onye ọbụla nʼobi, gbata ya eze Izrel nʼetiti njikọ ihe ikpuchi obi na uwe agha ya. Eze gwara onye ọkwọ ụgbọ agha, sị, “Tụgharịa, si nʼebe a bupụ m nʼihi na emerụọla m ahụ.” 34 Agha ahụ siri ike nʼụbọchị ahụ niile. Eze Izrel guzobere onwe ya ka ọ kwụrụ ọtọ nʼime ụgbọ agha ya na-eche ndị Aram ihu ruo uhuruchi. Ọ nwụrụ mgbe anyanwụ dara.
<- 2 Ihe E Mere 172 Ihe E Mere 19 ->-
a 18:7 Nke a bụghị onye dere akwụkwọ Maika, nke bụ otu akwụkwọ nʼime akwụkwọ nsọ