1 Otu ụbọchị, ozi rutere Devid ntị na ndị Filistia na-ebuso ndị obodo Keila[a] agha na-apụnara ha ihe niile ha nwere nke dị nʼebe ịzọcha ọka ha niile. 2 Devid jụrụ 
3 Ma ndị agha Devid sịrị ya, “Lee, anyị onwe anyị na-atụ egwu ihe a ga-eme anyị, ọ bụladị nʼime Juda, oleekwanụ otu anyị ga-esi jee buso ndị Filistia niile agha na Keila?”
4 Devid jụrụ 
7 Mgbe a gwara Sọl na Devid nọ na Keila, o kwuru sị, “Ahaa! Chineke enyefeela ya nʼaka m, nʼihi na Devid e jirila aka ya kee onwe ya agbụ site nʼịbanye nʼobodo nwere ibo ọnụ ụzọ na mkpọrọ e ji akpọchi ha.” 8 Sọl chịkọtara ndị agha ya ịga Keila ịnọchibido Devid na ndị ikom ya.
9 Mgbe Devid nụrụ ihe Sọl na-achọ ime, ọ gwara Abịata onye nchụaja sị ya, “Chịta efọọd ahụ.”[b] 10 Devid sịrị, “O! 
12 Ọzọkwa, Devid jụrụ sị, “Ndị nwe Keila ha ga-arara m na ndị ikom m nye nʼaka Sọl?”
13 Nʼihi ya, Devid na ndị ikom ya ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom isii, hapụrụ Keila pụọ na-awagharị site nʼotu ebe gaa nʼebe ọzọ. Mgbe Sọl nụrụ na Devid esitela na Keila pụọ, o jekwaghị ebe ahụ ọzọ.
14 Nʼoge a, Devid nọgidere nʼebe e wusiri ike dị nʼọzara, na nʼala ugwu ugwu nke ọzara Zif. Ụbọchị niile, Sọl chọgharịrị ya ma Chineke enyefeghị Devid nʼaka ya.
15 Mgbe Devid nọ na Horesh, nke dị nʼọzara Zif, ọ natara ozi na Sọl na-abịa igbu ya. 16 Jonatan, nwa Sọl pụrụ ịchọ Devid. Mgbe ọ hụrụ ya na Horesh, ọ gbara ya ume, nyere ya aka iguzosi ike nʼime Chineke. 17 Jonatan sịrị ya, “Atụla egwu, nna m Sọl apụghị ịchọta gị. Ị ga-abụ eze Izrel. Aga m abụkwa onye na-eso gị dịka Sọl nna m maara nke ọma.” 18 Ha abụọ gbara ndụ nʼihu 
19 Ma ndị Zif biliri jekwuru Sọl na Gibea sị ya, “Devid o zoghị onwe ya nʼetiti anyị nʼọgba nkume dị nʼọhịa Horesh, nʼugwu Hakila, na ndịda Jeshimọn? 20 Ugbu a, eze anyị, bịa mgbe ọbụla ị chọrọ, ka anyị gaa jidere gị ya. Ị ga-emekwa ya dịka obi gị sị chọọ.”
21 Sọl zara ha sị, “
24 Ha biliri buru Sọl ụzọ gawa Zif. Nʼoge a, Devid na ndị agha ya nọ nʼọzara Maon, nʼime Araba, na ndịda Jeshimọn. 25 Sọl na ndị agha ya bịarutere ebe ahụ malite chọwa Devid. Mgbe a gwara Devid na Sọl na-achọ ya, o duuru ndị agha ya gbada gaa nʼoke nkume ahụ ma nọgide nʼọzara Maon. Mgbe Sọl nụrụ nke a, ọ chụgidekwara Devid ọsọ gaa nʼebe ahụ.
26 Mgbe ha ruru nʼebe ahụ, Sọl na ndị agha ya nọ nʼotu akụkụ ugwu ahụ, Devid na ndị agha ya nọkwa nʼakụkụ nke ọzọ, na-eme ngwa ka ha gbanarị Sọl. Ma Sọl na ndị agha ya na-abịa nnọọ nso ijide Devid. 27 Ma nʼotu mgbe ahụ, onyeozi bịakwutere Sọl sị ya, “Mee ngwangwa, lọta, nʼihi na ndị Filistia apụtala ibuso Izrel agha.” 28 Ngwangwa, Sọl sitere nʼịchụ Devid chigharịa azụ, lọta ibuso ndị Filistia agha. Site nʼoge ahụ, a kpọrọ ebe ahụ Devid nọ, Sela Hamahlekot, nke pụtara, Nkume Nkewa. 29 Devid si nʼebe ahụ pụọ gaa biri nʼebe e wusiri ike nke En-Gedi, ebe o zoro onwe ya.
<- 1 Samuel 221 Samuel 24 -> Languages
Languages