1 Nʼoge ahụ, Nahash, eze ndị Amọn,[a] duuru ndị agha ya bilie imegide ndị Izrel bi nʼala Jebesh Gilead. Ma ndị Jebesh rịọrọ ya sị, “Ka anyị na gị gbaa ndụ, anyị ga-anọ nʼokpuru ọchịchị gị.”
2 Ma Nahash, onye Amọn zara sị ha, “Mụ na unu ga-agba ndụ ma ọ bụrụ na unu ekwenye ka m ghụpụta anya aka nri nke onye ọbụla nʼime unu, si otu a wetara Izrel niile ihe nkọcha.”
3 Ndị okenye obodo Jebesh zara sị, “Nye anyị abalị asaa ka anyị ziga ndị ozi nʼala Izrel niile. Ọ bụrụ na o nweghị onye kwere ịbịa zọpụta anyị, anyị ga-ewere onwe anyị nyefee gị nʼaka.”
4 Mgbe ndị ozi ha zipụrụ bịaruru Gibea, nke bụ obodo Sọl, ha kọọrọ ndị mmadụ ihe ndị a, ha niile dapụrụ nʼakwa. 5 Ma nʼoge a, Sọl si nʼubi na-alọta, soro ụmụ ehi ya nʼazụ, ọ jụrụ, “Ọ bụ gịnị na-eme onye ọbụla? Gịnị mere na ha ji ebe akwa?” Ha kọọrọ ya ihe banyere ozi e si Jebesh zite.
6 Mgbe Sọl nụrụ ozi a, Mmụọ nke Chineke bịakwasịrị ya nʼike, iwe wekwara ya nke ukwuu. 7 Ọ kpụpụtara ehi abụọ bọkasịa ha, zipụ ndị ozi ka ha buru ha ga obodo niile dị nʼIzrel. Ozi ha ga-ezi ndị obodo ọbụla bụ nke a. “Ọ bụ ihe e mere ehi ndị a ka a ga-eme ehi onye ọbụla jụrụ iso Sọl na Samuel jee ọgụ.”
9 Ha gwara ndị zitere ozi ahụ okwu sị ha, “Zienụ ndị ikom Jebesh Gilead, ‘Echi, tupu anyanwụ achaa nʼuju ya, a ga-anapụta unu.’ ” Mgbe ndị ozi a gara zie ndị ikom Jebesh Gilead ozi a, ha ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu. 10 Ndị ikom Jebesh ziri ozi gwa ndị Amọn sị ha, “Echi, anyị ga-enye unu onwe anyị, ka unu mee anyị ihe masịrị unu.”
11 Ma nʼụtụtụ echi, Sọl na ndị agha ya bịaruru. O kewara ndị agha ya ụzọ atọ, buso ụmụ Amọn agha na mberede nʼisi ụtụtụ. O gbugidere ha ụtụtụ niile ruo mgbe anyanwụ chara nʼuju ya, chụsasịa ndị fọdụrụ nʼime ha. Nke a mere na o nweghị ebe a ga-ahụ ka ndị agha Amọn abụọ nọkọtara.
12 Ndị Izrel niile bịakwutere Samuel jụọ ya sị, “Olee ndị ahụ sị na Sọl agaghị abụ eze anyị? Kpọpụtara anyị ha ka anyị gbuo ha!”
13 Ma Sọl zara sị, “O nweghị onye ọbụla a ga-egbu taa, nʼihi na taa,
14 Samuel gwara ha sị, “Bịanụ ka anyị gaa Gilgal mee ịbụ eze a ka ọ dị ọhụrụ ọzọ.” 15 Ya mere, mmadụ niile gara Gilgal. Na mmemme pụrụ iche, ha mere Sọl eze nʼihu
-
a 11:1 Ndị Amọn bụ ụmụ ụmụ Lọt, Jen 19:38; Dit 2:19 nʼoge Ndị Ikpe na-achị nʼIzrel, ha gbalịrị ibuso ha agha ka ha nara ha ala ha. Nkp 3:13; 11:4-33