1 Otu onye nke Chineke si Juda bịa Betel, site nʼokwu nke
4 Mgbe eze Jeroboam nụrụ ihe onye nke Chineke ahụ kwuru megide ebe ịchụ aja Betel, o setịpụrụ aka ya site nʼebe ịchụ aja ahụ sị, “Jidenụ nwoke a!” Ma aka ahụ ọ setịpụrụ tụgide nwoke ahụ kpọnwụrụ na o nwekwaghị ike iweghachi ya azụ ọzọ. 5 Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu
6 Mgbe ahụ, eze sịrị onye nke Chineke ahụ, “Biko, rịọọ
7 Emesịa, eze gwara onye nke Chineke ahụ okwu sị, “Soro m gaa nʼụlọ m. Aga m enye gị ihe oriri, nyekwa gị onyinye.”
8 Ma onye nke Chineke ahụ zara eze sị, “Ọ bụrụ na i nye m ọkara ihe niile i nwere, agaghị m eso gị baa nʼime ụlọ gị. Agaghị m erikwa nri gị maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe a. 9 Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu
11 Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze. 12 Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara. 13 Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu m.” Ha jikekwaara ya ịnyịnya ibu, ọ nọkwasịrị nʼelu ya. 14 Ọ gbasooro onye nke Chineke nʼazụ, ọ hụrụ ya ka ọ nọ ala nʼokpuru osisi ook, Ọ sịrị ya, “Ọ bụ gị bụ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa?”
15 Onye amụma ahụ sịrị ya, “Soro m ka anyị gaa nʼụlọ m, ka i rie nri.”
16 Ma ọ sịrị, “Apụghị m iso gị laghachi azụ, maọbụ rie nri, ma ọ bụkwa ṅụọ mmiri ọbụla nʼebe a. 17 Nʼihi na a gwara m site nʼokwu
18 Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu
20 Ma mgbe ha abụọ nọdụ na-eri ihe na tebul, okwu
23 Mgbe onye nke Chineke ahụ risiri nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, ha kwadooro ya ịnyịnya ibu nke onye amụma ahụ kpọghachiri ya azụ. 24 Dịka ọ na-alaghachi, otu ọdụm zutere ya nʼụzọ, dọgbuo ya. Ma ọ hapụrụ ozu ya ka ọ tọgbọrọ nʼokporoụzọ, ma ịnyịnya ibu ya ma ọdụm ahụ dọgburu nwoke ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ya. 25 Ndị mmadụ na-agafe hụrụ ozu ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ, hụkwa ka ọdụm ahụ guzo nʼakụkụ ya. Ndị a gara kọọ akụkọ ihe ha hụrụ nʼụzọ nʼobodo ebe onye amụma agadi ahụ bi.
26 Mgbe onye amụma ahụ mere ka ọ laghachi azụ nụrụ ihe mere, ọ sịrị, “Ọ bụ onye nke Chineke ahụ nupuru isi nʼokwu
27 Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu.” Ha mere otu a. 28 Ọ pụrụ gaa chọta ozu nwoke ahụ ka ọ tọgbọrọ nʼụzọ. Ịnyịnya ibu ya na ọdụm ahụ guzokwa nʼakụkụ ozu ahụ. Ọdụm erighị anụ nwoke ahụ, ọ dọgbukwaghị ịnyịnya ibu ahụ. 29 Onye amụma agadi ahụ buliri ozu onye nke Chineke ahụ dọkwasị ya nʼelu ịnyịnya ibu ya, buru ya bughachi ya nʼobodo, nʼihi iruru ya ụjụ, nakwa ili ya. 30 O liri ozu onye nke Chineke ahụ nʼili nke aka ya. Mgbe o liri ya, ọ kwara akwa sị, “Ewoo nwanna m!”
31 Mgbe o lisiri ya, ọ gwara ụmụ ya ndị ikom sị, “Mgbe m nwụrụ, lienụ m nʼotu ili a e liri onye nke Chineke; doonụ ọkpụkpụ m ka ọ dịrị nʼakụkụ ọkpụkpụ ya. 32 Nʼihi na ozi ahụ niile o ziri site nʼokwu
33 Nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, Jeroboam esiteghị nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Kama ọ gara nʼihu họpụta ndị nchụaja maka ebe niile dị elu site nʼetiti ndị mmadụ efu. Onye ọbụla chọrọ ị bụ onye nchụaja ka o doro nsọ maka ije ozi nʼebe niile dị elu. 34 [b]Nke a bụ mmehie ezinaụlọ Jeroboam. Ọ bụ ya mere alaeze Jeroboam ji daa, meekwa ka e kpochapụ ya nʼelu ụwa.
<- 1 Ndị Eze 121 Ndị Eze 14 ->