10 Nʼoge Sọl bụ eze Izrel, ụmụ Ruben meriri ndị Haga nʼagha, bichie ala ha niile dị nʼọwụwa anyanwụ Gilead.
16 Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị.
17 E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel.
18 Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha. 19 Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha. 20 E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi. 21 Ha ji ike chịkọrọ anụ ụlọ ndị Haga, dị iri puku ịnyịnya kamel ise, narị puku atụrụ abụọ na iri puku ise, puku ịnyịnya ibu abụọ. Ha dọkpụkwara narị puku ndị mmadụ nʼagha. 22 E gbukwara ọtụtụ ndị mmadụ nʼihi na agha ahụ bụ nke Chineke lụrụ nʼonwe ya. Ha bichiri ala ahụ tutu ruo mgbe a dọọrọ Izrel niile nʼagha.
23 Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.
24 Ndịisi ikwu ha niile bụ ndị a: Efaa, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremaya, Hodavaya na Jadiel. Ndị a niile bụ dimkpa nʼagha, ndị a ma ama na ndịisi ezinaụlọ. 25 Ma ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke nna nna ha. Kama ha merụrụ onwe ha site nʼife chi niile nke ndị bi nʼala ahụ na mbụ, bụ ndị Chineke lara nʼiyi nʼihu ha. 26 Nʼihi nke a, Chineke nke Izrel kpaliri mmụọ Pul, bụ eze Asịrịa (ya bụ Tiglat-Pilesa[a] eze ndị Asịrịa), ka o bilie megide ndị Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase, dọta ha nʼagha, buru ha gaa Hala, na Hoboa, na Hara na osimiri Gozan, ebe ha nọ ruo taa.
<- 1 Ihe E Mere 41 Ihe E Mere 6 ->-
a 5:26 Tiglat-Pilesa bụkwa onye a na-akpọ Pul, hụ nke a nʼakwụkwọ 2Ez 15:19