1 Mgbe Devid wuchara ụlọ obibi ya nʼobodo Devid, o doziri ebe a ga-adọsa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Ọ mara ụlọ ikwu maka ya. 2 Devid kwuru sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ebu igbe Chineke karịakwa ndị Livayị, nʼihi na
3 Ya mere, Devid kpọkọtara ndị Izrel niile, na Jerusalem ibubata igbe Onyenwe anyị nʼebe ahụ ọ kwadoro na a ga-adọsa ya.
11 Devid kpọrọ Zadọk na Abịata, ndị nchụaja na Uriel, Asaya, Juel, Shemaya, Eliel, na Aminadab ndị Livayị sị ha, 12 “Unu bụ ndịisi ezinaụlọ dị iche iche, nʼebo Livayị. Doonụ onwe unu nsọ unu na ụmụnna unu ibulata igbe ọgbụgba ndụ
16 Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.
17 Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya, 18 tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
19 Heman, Asaf na Etan ka a họpụtara maka ịkụ ogene bronz. 20 Zekaraya na Aziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Maaseia na Benaya bụ ndị na-akpọ ụbọ akwara dịka usoro abụ alamot, si dị 21 Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị. 22 Onyeisi ndị na-abụ abụ a họpụtara bụ Kenaniya, onye bụkwa onyeisi ndị Livayị. A họpụtara ya nʼihi na ọ bụ onye nwere nghọta banyere abụ.
23 Berekaya na Elkena bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị. 24 Shebanaya, Joshafat, Netanel, Amasai, Zekaraya, Benaya na Elieza, ndị bụ ndị nchụaja bụ ndị na-afụ opi nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Chineke. Obed-Edọm na Jehaya ga-esokwa ndị ga-eche ọnụ ụzọ ebe igbe ahụ dị nche.
25 Devid na ndị okenye Izrel, na ndịisi agha na-achị puku ndị agha, ji oke ọṅụ gaa nʼụlọ Obed-Edọm nʼihi ibugote igbe ọgbụgba ndụ
29 Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ