1 Devid na ndịisi agha ya na-achị imerime puku ndị agha, na ọtụtụ narị ndị agha, zukọrọ gbaa izu. 2 Ọ gwara ọgbakọ Izrel niile ahụ sị, “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, ọ bụrụkwa na ọ bụ ọchịchọ
5 Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ndị Izrel niile oku ka ha zuo ezuo site nʼebe niile ha bi, site nʼoke ala ha na ndị Ijipt, ya bụ iyi Shiho, ruo nʼoke ala dị nʼugwu, ya bụ Lebo Hamat, ka ha gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke site na Kiriat Jearim. 6 Devid na ndị Izrel niile jere Baala nʼime Juda, ya bụ Kiriat Jearim, i si nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, bụ
7 Ha ji ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ buru igbe ọgbụgba ndụ Chineke site nʼụlọ Abinadab, Ụza na Ahio na-eduzi ụgbọala ahụ ụzọ. 8 Devid na ndị Izrel niile weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Chineke, jiri abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na iti egwu na-etekwa egwu.
9 Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Kidon, Ụza setịpụrụ aka ya ijide igbe ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ. 10 Ma iwe
11 Mgbe ahụ, iwe were Devid nʼihi ọnụma
12 Devid tụrụ egwu Chineke nʼụbọchị ahụ, o kwuru sị, “M ga-esi aṅaa bubatara onwe m igbe ọgbụgba ndụ a?” 13 O bubataghị igbe ọgbụgba ndụ ahụ nʼime obodo Devid, kama o bugara ya nʼụlọ Obed-Edọm, onye Git. 14 Igbe ọgbụgba ndụ Chineke ahụ nọrọ nʼezinaụlọ Obed-Edọm nʼụlọ ya ọnwa atọ.